Joel
2 “Fụọnụ opi na Zayọn,+ tiekwanụ mkpu agha+ n’ugwu nsọ m.+ Ka ndị niile bi n’ala a maa jijiji;+ n’ihi na ụbọchị Jehova na-abịa,+ n’ihi na ọ dị nso! 2 Ọ bụ ụbọchị ọchịchịrị na itiri ga-agba,+ ụbọchị ígwé ojii na oké ọchịchịrị, dị ka ìhè chi ọbụbọ nke na-enwu n’elu ugwu.+
“Ọ dị mba nke nwere ụba mmadụ, nke dịkwa ike;+ e metụbeghị ka nke yiri ya dịrị malite n’oge ochie a na-amaghị ama,+ ọ gasịakwa, a gaghị enwe ya ọzọ ruo afọ nke ọgbọ niile. 3 Ọkụ erepịawo ihe n’ihu ya,+ ire ọkụ na-erepịakwa ihe n’azụ ya.+ Ala nke dị n’ihu ya dị ka ogige Iden;+ ma ala ịkpa nke tọgbọrọ n’efu dị ya n’azụ, ọ dịghịkwa ihe na-agbanahụ ya.
4 “Ọdịdị ya dị ka ọdịdị ịnyịnya, ọ na-agbakwa ọsọ dị ka ịnyịnya agha.+ 5 Mkpọtụ ọ na-eme mgbe ọ na-awụgharị dị ka nke ụgbọ ịnyịnya nọ n’elu ugwu,+ dị ka mkpọtụ ire ọkụ nke na-erepịa ahịhịa ọka.+ Ọ dị ka mba dị ike, nke a haziri n’usoro maka ibu agha.+ 6 Ndị mmadụ ga-anọ n’oké ihe mgbu n’ihi ya.+ Ihu niile ga-achagharị n’ihi nchegbu.+
7 “Ha na-agba ọsọ dị ka ndị dị ike.+ Ha na-arịgo mgbidi dị ka ndị agha. Ha na-agakwa, onye ọ bụla n’ụzọ nke ya, ha adịghị ahapụ ụzọ ha.+ 8 Ha adịghịkwa enupụ ibe ha. Ha na-aga dị ka dimkpa nke na-aga ebe ọ na-aga n’eleghị anya n’azụ; ọ bụrụgodị na akụ́ ụta atụta ụfọdụ, ndị nke ọzọ adịghị akwụsị ịga ebe ha na-aga.
9 “Ha ji ọsọ na-abanye n’ime obodo. Ha na-agba ọsọ n’elu mgbidi. Ha na-arịgo n’elu ụlọ. Ha si na windo abanye dị ka ndị ohi. 10 Ala amawo jijiji n’ihu ha, eluigwe amawo jijiji. Anyanwụ na ọnwa agbawo ọchịchịrị,+ kpakpando akwụsịwokwa inye ìhè ha.+ 11 Jehova ga-ekwukwa okwu+ n’ihu ụsụụ ndị agha ya,+ n’ihi na ndị agha ya dị ọtụtụ nke ukwuu.+ N’ihi na onye ahụ nke na-emezu okwu ya dị ike; n’ihi na ụbọchị Jehova bụ oké ụbọchị,+ ọ dịkwa oké egwu, ònyekwa pụrụ iguzo mgbe ọ bịara?”+
12 “Ugbu a kwa,” ka Jehova kwuru, “jirinụ obi unu dum,+ na ibu ọnu+ na ịkwa ákwá na iti mkpu arịrị+ lọghachikwute m. 13 Dọwaakwanụ obi unu,+ ọ bụghị uwe unu;+ lọghachikwutenụ Jehova bụ́ Chineke unu, n’ihi na ọ na-eme amara, na-emekwa ebere,+ ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ obiọma*+ ya dịkwa ukwuu, ọdachi ahụ ga-ewutekwa ya.+ 14 Ònye manụ ma ọ̀ ga-atụgharị gbanwee obi ya+ wee kwe ka ngọzi,+ àjà ọka* na àjà ihe ọṅụṅụ maka Jehova bụ́ Chineke unu fọdụ mgbe e mesịrị?
15 “Fụọnụ opi na Zayọn.+ Kwuonụ ka e nwee obubu ọnụ dị nsọ.+ Kpọọnụ òkù ka e nwee nzukọ ukwu.+ 16 Kpọkọtanụ mmadụ niile. Doonụ ọgbakọ ahụ nsọ.+ Kpọkọtanụ ndị agadi. Kpọkọtanụ ụmụaka na ndị na-aṅụ ara.+ Ka nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ si n’ọnụ ụlọ ya nke dị n’ime pụta, ka nwaanyị a na-alụ ọhụrụ sikwa n’ụlọ ndina ya pụta.
17 “Ka ndị nchụàjà, bụ́ ndị na-ejere Jehova ozi, kwaa ákwá n’agbata ihe owuwu ụzọ mbata na ebe ịchụàjà,+ sị: ‘Jehova, meere ndị gị ebere, emela ka ihe nketa gị bụrụ ihe nkọcha,+ ka ndị mba ọzọ chịwa ha. N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ga-eji kwuo, sị: “Olee ebe Chineke ha nọ?”’+ 18 Jehova ga-anụ ọkụ n’obi maka ala ya,+ ọ ga-enwekwara ndị ya ọmịiko.+ 19 Jehova ga-azakwa ndị ya, sị, ‘Lee, ana m ezitere unu ọka na mmanya ọhụrụ na mmanụ, ọ ga-ejukwa unu afọ;+ m gaghị eme ọzọ ka unu bụrụ ihe nkọcha n’etiti mba dị iche iche.+ 20 M ga-emekwa ka ndị si n’ebe ugwu+ si n’ebe unu nọ pụọ gaa n’ebe dị anya, m ga-achụsakwa ha chụga ha n’ala mmiri na-adịghị nakwa n’ebe tọgbọrọ n’efu, chụga ndị nke nọ n’ihu n’oké osimiri ọwụwa anyanwụ,+ chụgakwa ndị nọ n’azụ n’oké osimiri ọdịda anyanwụ.+ Ísìsì ha ga na-ala elu, ísì ọjọọ ha ga na-ala elu;+ n’ihi na Chineke ga-eme oké ihe.’
21 “Atụla egwu, ala. Ṅụrịa ọṅụ; n’ihi na Jehova ga-eme oké ihe.+ 22 Atụla egwu, unu anụ ọhịa,+ n’ihi na ala ịta ahịhịa ndị dị n’ala ịkpa ga-ejupụta n’ahịhịa ndụ.+ N’ihi na osisi ga-amị mkpụrụ ya.+ Osisi fig na osisi vaịn ga-eji ike ha dum mịa mkpụrụ.+ 23 Unu ụmụ Zayọn, ṅụrịanụ ọṅụ n’ime Jehova bụ́ Chineke unu;+ n’ihi na ọ ghaghị ime ka unu nwee ụbịa mmiri otú o kwesịrị.+ Ọ ga-emekwa ka oké mmiri ozuzo zooro unu, ụbịa mmiri na ụla mmiri, dị ka ọ na-ezo na mbụ.+ 24 Ebe nzọcha mkpụrụ ga-ejupụta n’ọka a zọchara azọcha, olulu ịzọchapụta mmanya ga-ejupụtakwa ná mmanya ọhụrụ na mmanụ.+ 25 M ga-etikwa unu aka n’obi maka afọ ndị ahụ igurube, bụ́ igurube na-arị arị, ndị na-enweghị nku, nakwa ọchịcha na egú ripịara ihe, bụ́ ụsụụ ndị agha m dị ike, ndị m zitere n’etiti unu.+ 26 Unu ga-eri ihe, rijuo afọ,+ unu aghaghịkwa ito aha Jehova bụ́ Chineke unu,+ bụ́ onye mewooro unu ihe ndị dị ebube;+ ihere agaghịkwa eme ndị m ruo mgbe ebighị ebi.+ 27 Unu ga-amarakwa na m nọ n’etiti Izrel+ nakwa na mụ onwe m bụ Jehova bụ́ Chineke unu, e nweghịkwa ọzọ.+ Ihere agaghị eme ndị m ruo mgbe ebighị ebi.
28 “Ọ ga-erukwa na mgbe e mesịrị, m ga-awụkwasị mmụọ+ m n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla,+ ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom+ ga-ebukwa amụma. Ndị agadi unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụụ. 29 M ga-awụkwasịkwa mmụọ m+ ọbụna n’ahụ́ ndị ikom na-eje ozi nakwa n’ahụ́ ndị inyom na-eje ozi n’ụbọchị ndị ahụ.
30 “M ga-emekwa ka e nwee ihe ebube n’eluigwe+ nakwa n’ụwa, ọbara na ọkụ na ogidi anwụrụ ọkụ.+ 31 A ga-eme ka anyanwụ ghọọ ọchịchịrị,+ meekwa ka ọnwa ghọọ ọbara,+ tupu oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova abịa.+ 32 Ọ ga-erukwa na onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova ga-alanahụ;+ n’ihi na ndị gbapụrụ agbapụ ga-anọ n’Ugwu Zayọn nakwa na Jeruselem,+ dị nnọọ ka Jehova kwuru, nọrọkwa n’etiti ndị lanahụrụ alanahụ, bụ́ ndị Jehova na-akpọ.”+