Abụ Ọma
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya n’ụda Sheminit.* Abụ Devid.
2 Jehova, biko, meere m amara,* n’ihi na ike na-agwụ m.
Jehova, biko, gwọọ m,+ n’ihi na ọkpụkpụ m na-ama jijiji.
4 Jehova, biko, lọghachi ka ị napụta m.*+
5 N’ihi na onye nwụrụ anwụ anaghị akpọ aha* gị.
6 Ude m na-asụ emeela ka ike gwụ m.+
Anya mmiri m na-ede àkwà* m abalị niile.
Ákwá m na-ebe na-eme ka anya mmiri m dee ihe m ji edina ala.+
7 Uju m na-eru emeela ka anya m gharazie ịna-ahụcha ụzọ.+
Ọ na-ahụzi inyoghi inyoghi n’ihi ndị niile na-achọ m okwu.
9 Jehova ga-anụ arịrịọ m na-arịọ ka o meere m amara.+
Jehova ga-aza ekpere m.
10 A ga-eme ka ihere mee ndị iro m niile, obi adaa ha mbà.
Ihere ga-ejide ha na mberede, ha alaghachi azụ.+