Ilu
22 Ọ ka mma inwe ezigbo aha kama inweju akụnụba.+
Ọ ka mma ịbụ onye a na-akwanyere ùgwù kama inwe ọlaọcha na ọlaedo.
3 Onye ma ihe hụ nsogbu, ọ na-aga zoo,
Ma ndị na-amaghị ihe na-agara banye ná nsogbu, ha na-atakwa ahụhụ ya.
4 Ịdị umeala n’obi na ịtụ egwu Jehova
Na-eme ka mmadụ baa ọgaranya, dịrị ndụ ma bụrụ onye a na-akwanyere ùgwù.+
6 Zụọ nwata ka o soro ụzọ o kwesịrị iso.+
Ọ bụrụgodị na o mee okenye, ọ gaghị ahapụ ụzọ ahụ.+
10 Chụpụ onye na-akwa mmadụ emo
Ka okwu na ụka bie.
Esemokwu na mkparị ga-akwụsịkwa.
13 Onye umengwụ na-asị: “Ọdụm nọ n’èzí!
Ọ ga-adọgbu m n’ámá obodo!”+
14 Ọnụ ụmụ nwaanyị ndị rụrụ arụ* dị ka olulu miri emi.+
Onye Jehova mara ikpe ga-adaba na ya.
16 Onye na-erigbu ogbenye ka o wee bakwuo ọgaranya+
Nakwa onye na-enye ọgaranya onyinye
Ga-ada ogbenye.
17 Tọọ ntị n’ala nụrụ, geekwa ntị n’ihe onye ma ihe na-ekwu,+
Ka i wee jiri obi gị nabata ihe m na-akụzi,+
18 N’ihi na ọ dị mma ka i mee ka ha bamie gị n’ime ime obi,+
Ka i wee na-ekwu gbasara ha mgbe niile.+
19 M na-eme ka ị mụta ihe taa,
Ka i wee tụkwasị Jehova obi.
20 E nwere ihe ndị m dere nye gị,
Bụ́ ndị m ji dụọ gị ọdụ ma mee ka ị mụta ihe,
21 Ka m wee kụziere gị eziokwu,
Ka i wee laghachi kọọrọ onye zitere gị ihe ndị bụ́ eziokwu.
22 Apụnarala ogbenye ihe ya maka na ọ dara ogbenye,+
Emegbukwala ogbenye n’ọnụ ụzọ ámá obodo,+
23 N’ihi na Jehova ga-ekpechitere ha ọnụ ha,+
Ọ ga-egbukwa ndị na-erigbu ha.
24 Gị na onye na-ewe iwe ọkụ akpala,
Gị na onye na-ewekarị iwe emekọkwala ihe,
25 Ka ị ghara ịmụta àgwà ya
Wee tinye onwe gị ná nsogbu.+
26 Esola ná ndị na-ekweta* na ha ga-ana onye ọzọ n’ibé,
Ndị na-ekwe nkwa na ha ga-akwụ ego onye ọzọ bitere.+
Ọ gaghị eguzo n’ihu ndị nkịtị.