3 Nwa m, echefula ihe m na-akụziri gị,
Jiri obi gị niile na-edebe iwu dị iche iche m na-enye gị,
2 N’ihi na ha ga-eme ka ị dịtee ndụ aka,
Meekwa ka obi ruo gị ala.+
3 Akwụsịla ịhụ ndị ọzọ n’anya, akwụsịkwala igosi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+
Yiri àgwà ndị a n’olu gị ka ihe olu.
Dee ha n’obi gị.+
4 I mee ya, ihe gị ga na-amasị ma Chineke ma mmadụ,
Ha ga-ewerekwa gị ka onye na-aghọta ihe.+
5 Jiri obi gị niile tụkwasị Jehova obi,+
Atụkwasịla amamihe gị obi.+
6 N’ihe niile ị na-eme, chọpụta ihe bụ́ uche ya,+
Ọ ga-emekwa ka ihe gaziere gị.+
7 Amala ihe n’anya onwe gị.+
Tụọ egwu Jehova, hapụkwa ihe ọjọọ.
8 I mee otú a, ahụ́ ga-adị gị ka à gwọrọ gị ọrịa,
Ime ahụ́ ga-agbasikwa gị ike.
9 Sọpụrụ Jehova ma nye ya ihe ndị kacha mma i nwere,+
Ha na mkpụrụ mbụ nke ihe ọ bụla ị kụrụ n’ubi.+
10 Ihe ga-ejuzi n’ebe ndị ị na-akwasa ihe,+
Olulu ebe mmanya ọhụrụ ị zọchapụtara na-asọba ga-ejukwa n’ọnụ.
11 Nwa m, ajụla aka ná ntị Jehova na-adọ gị,+
Eledakwala mba ọ na-abara gị anya,+
12 N’ihi na ọ bụ ndị Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-abara mba,+
Otú nna si abara nwa ya ọ hụrụ n’anya mba.+
13 Onye nwetara amamihe+
Na onye na-aghọta ihe na-enwe obi ụtọ.
14 Inweta amamihe dị mma karịa inweta ọlaọcha.
Inweta ya dịkwa mma karịa inweta ọlaedo.+
15 Ọ bara uru karịa nkume kọral.
E nweghị ihe ọ bụla ọzọ ị chọrọ inweta a ga-eji tụnyere ya.
16 Ogologo ndụ dị n’aka nri ya.
Akụnụba na ùgwù dị n’aka ekpe ya.
17 Ịga n’ụzọ ya na-eme mmadụ obi ụtọ,
Ụzọ ya niile bụkwa ụzọ udo.+
18 Ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka osisi nke ndụ,
A ga-akpọkwa ndị na-ejidesi ya aka ike ndị na-enwe obi ụtọ.+
19 Jehova ji amamihe tọọ ntọala ụwa.+
O ji nghọta mee ka eluigwe kwụsie ike.+
20 O ji amamihe ya kewaa mmiri miri emi,
Na-emekwa ka mmiri si n’ígwé ojii na-ezo obere obere.+
21 Nwa m, elegharala ha anya.
Jidesie ezigbo amamihe aka ike, na-echebakwara ihe echiche nke ọma.
22 Ha ga-eme ka ị dị ndụ,
Ha ga-abụkwa ihe ị ga-eji chọọ olu gị mma.
23 Mgbe ahụ, e nweghị ihe ga-eme gị mgbe ị na-aga n’ụzọ,
Ụkwụ gị agaghịkwa akpọ n’ihe ọ bụla.+
24 Ụjọ agaghị atụ gị mgbe i dina ala.+
Ị ga-edina ala hie ụra, ụra ga-atọkwa gị ụtọ.+
25 Ị gaghị atụ ọdachi ọ bụla na-abịa na mberede ụjọ,+
Ị gaghịkwa atụ ụjọ mbibi a ga-ebibi ndị ajọ omume.+
26 N’ihi na Jehova ga-eme ka obi sie gị ike.+
Ọ ga-eme ka ọnyà ghara ịma gị.+
27 Ajụla imere ndị i kwesịrị imere ihe ọma ihe ọma+
Ma ọ bụrụ na i nwere ike inyere ha aka.+
28 Asịla onye agbata obi gị: “Lawa; e mechaa, gị abịa. M ga-emere gị ya echi,”
Ma ọ bụrụ na i nwere ike imere ya ihe ahụ ozugbo.
29 Akparala onye agbata obi gị nkata ọjọọ+
Mgbe o chere na gị na ya bi n’udo.
30 Esesala mmadụ okwu+
Ma ọ bụrụ na e nweghị ihe ọjọọ o mere gị.+
31 Enwerela onye tigbuo zọgbuo anyaụfụ,+
Akpakwala àgwà ka ya.
32 N’ihi na Jehova kpọrọ onye aghụghọ asị,+
Ma ya na onye ezi omume na-abụ ezigbo enyi.+
33 Jehova na-abụ ezinụlọ onye ajọ omume ọnụ,+
Ma ọ na-agọzi ezinụlọ onye ezi omume.+
34 Ọ na-akwa ndị na-akwa emo emo,+
Ma ọ na-emere ndị dị umeala n’obi amara.+
35 A ga-akwanyere ndị ma ihe ùgwù,
Ma a ga-akpụ ùgwù ndị nzuzu n’ala.+