Ekliziastis
7 Ezigbo aha ka ezigbo mmanụ mma,+ ụbọchị mmadụ nwụrụ kakwa ụbọchị a mụrụ ya mma. 2 Ọ dị mma ịga n’ebe a na-eru uju karịa ịga n’ebe a na-eri oriri,+ n’ihi na mmadụ niile na-anwụ anwụ, ndị dị ndụ kwesịkwara iburu ya n’obi. 3 Ọ ka mma na obi adịghị mmadụ mma karịa na mmadụ na-achị ọchị,+ n’ihi na ihe iwute mmadụ na-eme ka mmadụ mezie ndụ ya.+ 4 Obi ndị ma ihe na-adị n’ebe a na-eru uju, ma obi ndị nzuzu na-adị n’ebe a na-aṅụrị ọṅụ.*+
5 Ọ kaara mmadụ mma ige ntị ná mba onye ma ihe na-abara ya+ kama ige ntị n’abụ ndị nzuzu na-abụ. 6 N’ihi na ọchị onye nzuzu na-ada ụda ka ogwu nke na-ere ọkụ n’okpuru ite.+ Ihe a bụkwa ihe efu. 7 Ma mmegbu nwere ike ime ka onye ma ihe mewe ara ara, aka azụ* na-emebikwa obi mmadụ.+
8 Njedebe okwu dị mma karịa mmalite ya. Ọ ka mma inwe ndidi kama ịdị mpako.+ 9 Ekwela ka iwe na-ewe gị ọsọ ọsọ,+ n’ihi na ọ bụ ndị nzuzu na-ewe iwe ọsọ ọsọ.+
10 Asịla, “Gịnị mere oge gara aga ji ka oge a mma?” n’ihi na ị jụọ ajụjụ a, ị naghị egosi na ị ma ihe.+
11 Ọ bụrụ na onye ma ihe eketa akụnụba, ọ bụ ihe dị mma, ọ bakwaara ndị dị ndụ uru. 12 N’ihi na amamihe na-echebe mmadụ,+ ego na-echebekwa mmadụ.+ Ma uru mmadụ ịma ihe bara bụ na amamihe na-echebe onye nwere ya ndụ.+
13 Chebara ihe ezi Chineke na-arụ echiche, n’ihi na ònye nwere ike ịgbatị ihe o mere ka ọ gbagọọ agbagọọ?+ 14 N’ụbọchị ihe ọma mere, chebara ihe ọma merenụ echiche.+ Ma n’ụbọchị ihe ọjọọ mere,* cheta na ọ bụ Chineke kwere ka e nwee ụbọchị ọma na ụbọchị ọjọọ,+ ka ndị mmadụ wee ghara ịmata ihe ga-eme ha n’ọdịnihu.+
15 Ná ndụ a na-enweghị isi m dị,+ ahụla m ihe niile, ma onye ezi omume nke na-ala n’iyi maka na ọ na-eme ezi omume+ ma onye ajọ omume nke na-adịte ndụ aka n’agbanyeghị na ọ na-eme ajọ omume.+
16 Abụla onye oké ezi omume,+ abụkwala onye oké amamihe.+ Gịnị mere ị ga-eji laa onwe gị n’iyi?+ 17 Abụla onye ajọ omume gafee ókè, abụkwala onye nzuzu.+ Gịnị mere ị ga-eji nwụchuo ọnwụ?+ 18 Ọ kacha mma ka ị nabata ndụmọdụ abụọ a. Ajụla nke ọ bụla n’ime ha;+ n’ihi na onye na-atụ egwu Chineke ga-anabata ha abụọ.
19 Amamihe na-eme ka onye ma ihe sie ike karịa ụmụ nwoke iri siri ike e nwere n’obodo.+ 20 N’ihi na e nweghị onye ezi omume nọ n’ụwa nke na-eme naanị ihe dị mma, nke na-anaghịkwa emehie.+
21 Etinyekwala obi gị n’ihe niile ndị mmadụ na-ekwu;+ ma ọ́ bụghị ya, i nwere ike ịnụ ka onye na-ejere gị ozi na-akpọ gị iyi;* 22 n’ihi na ị ma n’ime obi gị na gịnwa akpọọla ndị ọzọ iyi ọtụtụ ugboro.+
23 M ji amamihe m nwere chebara ihe a niile echiche. M wee sị: “M ga-ama ihe.” Ma ọ karịrị m. 24 Ihe ndị merela ekweghị anyị nghọta, ha dịkwa nnọọ omimi. Ònye ga-aghọtali ha?+ 25 M kpebiri ịmata na inyocha na ịchọpụta ihe bụ́ amamihe nakwa ihe mere ihe dị iche iche ji eme. M kpebikwara ịghọta àgwà ọjọọ ndị nzuzu na-akpa na àgwà iberiibe ndị na-eme ara ara na-akpa.+ 26 M chọpụtaziri ihe a: Nwaanyị nke dị ka ọnyà,* nke obi ya dị ka ụgbụ azụ̀, nke aka ya dịkwa ka ịga a na-atụ ndị mkpọrọ, ka ọnwụ njọ.* Onye na-eme ihe dị ezi Chineke mma agaghị adaba n’aka nwaanyị ahụ,+ ma nwaanyị ahụ ga-ejide onye mmehie.+
27 Onye mkpọkọta kwuru, sị: “Lekwa ihe m chọpụtara.+ M chebaara ihe dị iche iche echiche tupu mụ ekwuwe ihe a, 28 ma achọtabeghị m ihe m nọ na-achọ. N’ime otu puku mmadụ, m chọtara naanị otu nwoke bụ́ onye ezi omume, ma achọtaghị m otu nwaanyị n’ime ha. 29 Naanị otu ihe a ka m chọpụtara: Ezi Chineke kere ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị ezi omume,+ ma ha echepụtala ihe dị iche iche.”+