Ozi Ọma Matiu Dere
6 “Lezienụ anya ka unu ghara ịna-eme ezi omume unu n’ihu ndị mmadụ ka ha wee hụ unu,+ ma ọ́ bụghị ya, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ n’aka Nna unu nke nọ n’eluigwe. 2 N’ihi ya, mgbe ị na-enye onyinye ebere,* afụla opi na-aga, dị ka ndị ihu abụọ na-eme n’ụlọ nzukọ na n’okporo ámá, ka ndị mmadụ wee too ha. N’eziokwu, ana m asị unu, ha enwetazuola ụgwọ ọrụ ha. 3 Ma, i nyewe onyinye ebere, ekwela ka aka ekpe gị mara ihe aka nri gị na-eme, 4 ka onyinye ebere gị wee bụrụ na nzuzo. Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụkwa gị ụgwọ.+
5 “Mgbe unu na-ekpekwa ekpere, unu adịla ka ndị ihu abụọ,+ n’ihi na ọ na-atọ ha ụtọ iguzo n’ụlọ nzukọ, na ebe ụzọ gbara mkpị na-ekpe ekpere ka ndị mmadụ wee na-ahụ ha.+ N’eziokwu, ana m asị unu, ha enwetazuola ụgwọ ọrụ ha. 6 Ma, ị chọọ ikpe ekpere, banye n’ọnụ ụlọ gị. Mgbe i mechiri ụzọ gị, kpeere Nna gị nke nọ na nzuzo ekpere.+ Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụ gị ụgwọ. 7 Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro, dị ka ndị mba ọzọ na-eme, n’ihi na ha na-eche na a ga-anụ olu ha n’ihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu. 8 N’ihi ya, unu emela ka ha, n’ihi na Nna unu ma ihe na-akpa unu+ tupu unu arịọ ya.
“‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị+ nsọ.+ 10 Ka Alaeze gị+ bịa. Ka uche gị+ meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.*+ 11 Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa.+ 12 Gbaghara anyị ụgwọ anyị ji, dị ka anyị gbaghakwaara ndị ji anyị ụgwọ.+ 13 Ekwela ka a nwata anyị,*+ kama napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.’+
14 “N’ihi na ọ bụrụ na unu na-agbaghara ndị mehiere unu, Nna unu nke eluigwe ga na-agbagharakwa unu.+ 15 Ma ọ bụrụ na unu anaghị agbaghara ndị mehiere unu, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu mmehie unu.+
16 “Mgbe unu na-ebu ọnụ,+ kwụsịnụ ịgbarụ ihu dị ka ndị ihu abụọ, n’ihi na ha na-emebi ihu ha* ka ndị mmadụ wee hụ na ha na-ebu ọnụ.+ N’eziokwu, ana m asị unu, ha enwetazuola ụgwọ ọrụ ha. 17 Ma, mgbe ị na-ebu ọnụ, tee mmanụ n’isi gị, saakwa ihu gị, 18 ka i wee bụrụ onye na-ebu ọnụ n’anya Nna gị nke nọ na nzuzo, ọ bụghị n’anya mmadụ. Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụkwa gị ụgwọ.
19 “Kwụsịnụ ịkpakọtara onwe unu akụ̀ n’ụwa,+ ebe ọ ga-ata nchara, egu* erichapụkwa ya, ebe ndị ohi na-abanye zuo ohi. 20 Kama, na-akpakọtaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe,+ ebe ọ na-agaghị ata nchara, egu agaghịkwa eri ya,+ ebe ndị ohi na-anaghịkwa abanye zuo ohi. 21 N’ihi na n’ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.
22 “Anya dị ka ihe na-enye ahụ́ ìhè.+ N’ihi ya, ọ bụrụ na anya gị na-elegide otu ebe,* ahụ́ gị niile ga-abụ ìhè ìhè.* 23 Ma ọ bụrụ na ihe anya gị na-ahụ na-eme ka ị bụrụ onye anyaụfụ,*+ ahụ́ gị niile ga-agba ọchịchịrị. Ọ bụrụ n’eziokwu na ìhè dị n’ime gị bụ ọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ agaghị enwe atụ.
24 “O nweghị onye ga-abụli ohu nna ukwu abụọ. N’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya,+ ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu agaghị abụli ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.+
25 “N’ihi ya, ana m asị unu: Kwụsịnụ ichegbu onwe unu+ banyere ndụ* unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ maka ihe unu ga-eyi n’ahụ́.+ Ọ̀ bụ na ndụ* adịghị mkpa karịa ihe oriri? Ahụ́ ọ́ dịghịkwa mkpa karịa uwe?+ 26 Leruonụ nnụnụ anya.+ Ha anaghị akụ mkpụrụ. Ha anaghị aghọrọ mkpụrụ, ha anaghịkwa ekpokọta mkpụrụ n’ụlọ a na-akwasa ihe. Ma, Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu abaghị uru karịa ha? 27 Ònye n’ime unu ga-agbakwụnyeli otu kubit* n’afọ ndụ ya maka na ọ na-echegbu onwe ya?+ 28 Gịnị mere unu ji na-echegbu onwe unu banyere uwe? Mụtanụ ihe n’otú okooko lili dị n’ọhịa si eto. Ha anaghị arụgbu onwe ha n’ọrụ, ha anaghịkwa akpa ogho. 29 Ma ana m asị unu na Solomọn+ eyighị uwe mara mma ka otu n’ime ha n’agbanyeghị ebube ya niile. 30 Ọ bụrụ na Chineke si otú a yiwe ahịhịa ndụ dị n’ọhịa uwe, nke dị ebe a taa, ma echi, a tụba ya n’ọkụ, ọ̀ bụ na ọ gaghị eyiwe unu uwe karịa, unu ndị okwukwe nta? 31 N’ihi ya, unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla,+ sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyi?’+ 32 N’ihi na ihe ndị a niile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsi ike. Nna unu nke eluigwe ma na ihe ndị a niile dị unu mkpa.
33 “N’ihi ya, burunụ ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.+ 34 N’ihi ya, unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi,+ n’ihi na a ga-enwe ihe unu ga-eche banyere ya echi. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuorola ya.