Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Galeshia
6 Ụmụnna m, ọ bụrụgodị na mmadụ azọhiewala ụkwụ tupu ya amata ihe ọ na-eme, unu ndị mmụọ Chineke na-edu, gbalịanụ jiri obi nwayọọ nyere onye ahụ aka.*+ Ma, ka onye ọ bụla n’ime unu na-eleru onwe ya anya+ maka na e nwekwara ike ịnwa ya.+ 2 Na-eburịtanụ ibu arọ ibe unu.+ Unu ga-esi otú ahụ na-erubere iwu Kraịst isi.+ 3 N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ chere na e nwere ihe ọ bụ mgbe ọ na-enweghị ihe ọ bụ,+ ọ na-aghọgbu onwe ya. 4 Ma, ka onye ọ bụla na-eleru ihe ọ na-eme anya,+ ka o wee na-enwe ọṅụ maka ihe ọ na-eme ma ghara ịna-eji onwe ya atụnyere onye ọzọ.+ 5 N’ihi na onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.+
6 Ka onye ọ bụla a na-akụziri okwu Chineke na onye na-akụziri ya ihe na-enyerịta ibe ha ihe ọma niile.+
7 Unu ekwela ka e duhie unu: Chineke abụghị onye a ga-aghọgbuli.* N’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha ka ọ ga-aghọrọ;+ 8 n’ihi na onye na-agha mkpụrụ otú ahụ́ ya chọrọ ga-esi n’ahụ́ ya ghọrọ mbibi, ma onye na-agha mkpụrụ otú mmụọ nsọ chọrọ ga-esi ná mmụọ nsọ ghọrọ ndụ ebighị ebi.+ 9 N’ihi ya, ka ike ime ihe dị mma ghara ịgwụ anyị, n’ihi na mgbe oge ruru, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.+ 10 N’ihi ya, ọ bụrụhaala na anyị nwere ike ime ya, ka anyị na-emere mmadụ niile ihe ọma, ma karịchaa, ndị bụ́ ụmụnna anyị n’okwukwe.
11 Eji m aka m detara unu akwụkwọ ozi a. Unu ahụla na m ji mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo dee ya.
12 Ọ bụ ndị niile chọrọ ka otú ha dị n’ahụ́ masị ndị mmadụ na-agbalị ka ha manye unu ka unu bie úgwù. Ihe mere ha ji eme ya bụ naanị na ha achọghị ka a kpagbuo ha n’ihi osisi ịta ahụhụ* Kraịst. 13 N’ihi na ndị ahụ a na-ebi úgwù anaghịdị edebe Iwu ahụ,*+ kama ha na-achọ ka e bie unu úgwù ka ha wee jiri ihe e mere ahụ́ unu na-anya isi. 14 Ma, ka a ghara inwe mgbe m ga-anya isi, ọ gwụla ma ọ̀ bụ iji Onyenwe anyị Jizọs Kraịst,+ onye nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ, nyaa isi. N’ihi ọnwụ ọ nwụrụ, ụwa dị m ka ihe nwụrụ anwụ, mụ adịrị ụwa ka onye nwụrụ anwụ. 15 N’ihi na ibi úgwù enweghị ihe ọ bụ, ebighị úgwù enweghịkwa ihe ọ bụ,+ ma ihe e kere ọhụrụ nwere ihe ọ bụ.+ 16 Ka udo na ebere dịrị ndị niile na-eso ntụziaka a, ya bụ, Izrel nke Chineke.+
17 Malite ugbu a gawa, ka onye ọ bụla ghara inye m nsogbu, n’ihi na ebu m apa ndị na-egosi na m bụ ohu Jizọs n’ahụ́ m.+
18 Ụmụnna m, ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara n’ihi àgwà ọma unu na-akpa. Amen.