3 “Ana m arịọ gị arịrịọ, Jehova, biko, cheta+ otú m si jiri eziokwu+ na obi zuru ezu+ jee ije+ n’ihu gị, ọ bụkwa ihe dị mma n’anya gị ka m mere.”+ Hezekaya wee malite ịkwasi ákwá ike.+
17 Chineke m, amaara m nke ọma na ị bụ onye na-enyocha obi,+ nakwa na ịkwụwa aka ọtọ na-atọ gị ụtọ.+ Mụ onwe m ji obi ziri ezi nye ihe ndị a niile n’afọ ofufo, obi dịkwa m ụtọ ịhụ ndị gị bịara ebe a ka ha na-enye gị onyinye n’afọ ofufo.