Ọpụpụ 22:25 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 25 “Ọ bụrụ na ị gbazinye otu n’ime ndị m ego, bụ́ onye nọ n’ahụhụ,+ nke bi gị nso, abụrụla ya onye na-anara ọmụrụ nwa. Unu anala ya ọmụrụ nwa.+ Levitikọs 25:36 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 36 Anala ya ọmụrụ nwa, anakwala ya ụma,+ kama tụọ egwu Chineke gị;+ nwanne gị ga-esoro gị dịrị ndụ. Diuterọnọmi 23:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 “Emela ka nwanne gị kwụọ ọmụrụ nwa,+ ọmụrụ nwa ego, ọmụrụ nwa nri,+ ọmụrụ nwa ihe ọ bụla mmadụ pụrụ ịnara ọmụrụ nwa na ya. Ezikiel 18:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 ọ dịghị emegbu onye nọ n’ahụhụ; ọ dịghị anara ọmụrụ nwa+ na ụma;+ ọ na-eme ihe m kpere n’ikpe;+ ọ na-ejekwa ije n’ụkpụrụ m;+ ya onwe ya agaghị anwụ n’ihi njehie nna ya.+ Ọ ga-anọgide na-adị ndụ.+
25 “Ọ bụrụ na ị gbazinye otu n’ime ndị m ego, bụ́ onye nọ n’ahụhụ,+ nke bi gị nso, abụrụla ya onye na-anara ọmụrụ nwa. Unu anala ya ọmụrụ nwa.+
19 “Emela ka nwanne gị kwụọ ọmụrụ nwa,+ ọmụrụ nwa ego, ọmụrụ nwa nri,+ ọmụrụ nwa ihe ọ bụla mmadụ pụrụ ịnara ọmụrụ nwa na ya.
17 ọ dịghị emegbu onye nọ n’ahụhụ; ọ dịghị anara ọmụrụ nwa+ na ụma;+ ọ na-eme ihe m kpere n’ikpe;+ ọ na-ejekwa ije n’ụkpụrụ m;+ ya onwe ya agaghị anwụ n’ihi njehie nna ya.+ Ọ ga-anọgide na-adị ndụ.+