37 “Kwụsịkwanụ ikpe ikpe, a gaghịkwa ekpe unu ikpe.+ Kwụsịkwanụ ịma ndị mmadụ ikpe, a gaghịkwa ama unu ikpe. Na-agbagharanụ* ndị mmadụ, a ga-agbagharakwa* unu.+
4 Ònye ka ị bụ na ị ga na-ekpe onye na-ejere onye ọzọ ozi ikpe?+ Ọ bụ Chineke bụ́ nna ya ukwu ga-ekpebi ma ihe ọ na-eme ọ̀ dị mma ka ọ̀ dị njọ.+ N’eziokwu, ebe Jehova* na-enyere ya aka, ihe ọ na-eme ga-adị ya mma.