29 Ama m na mgbe m na-anọghịzi ya, anụ ọhịa wolf ndị obi tara mmiri ga-abata ebe unu nọ.+ Ha agaghịkwa emere ìgwè atụrụ Chineke ebere. 30 Ụfọdụ ndị n’ime unu ga-ebidokwa ịna-ekwu ihe ndị na-abụghị eziokwu iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.+
12 Ihe m na-ekwu bụ na olu unu na-ada iche iche. Otu onye na-asị: “Ana m eso ụzọ Pọl,” onye ọzọ ana-asị, “Ana m eso ụzọ Apọlọs,”+ onye ọzọ ana-asị, “Ana m eso ụzọ Sifas,”* onye ọzọ ana-asịkwa, “Ana m eso ụzọ Kraịst.”
2Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’Izrel otú ahụ ụfọdụ n’ime unu ga-abụkwa ndị nkụzi ụgha.+ Ha ga-eji nwayọọ malite òtù dị iche iche ga-eme ka unu kwụsị inwe okwukwe. Ha ga-agọnahụkwa onye gbapụtara ha.*+ A ga-ebibikwa ha ngwa ngwa n’ihi ihe a ha ga-eme.