20 N’eziokwu, ọ bụrụ na ha hapụrụ ime ihe ọjọọ ndị a na-eme n’ụwa+ maka na ha amatala nke ọma banyere Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst, ma mechaa mewe ihe ọjọọ ndị ahụ ọzọ, ihe ndị ahụ ana-achị ha, ikpeazụ ha akala mmalite ha njọ.+
7 Ọ bụkwa ihe Chineke kwuru ga-eme ka a hapụ eluigwe na ụwa dị ugbu a ruo mgbe a ga-eji ọkụ bibie ha n’ụbọchị a ga-ama ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke ikpe ma bibie ha.+