Nọvemba
Tuzdee, Nọvemba 1
Mgbe onye ọ bụla na-aza okwu tupu ya anụ ya, ọ bụụrụ ya nzuzu na mmechuihu.—Ilu 18:13.
Ebe ọ bụ na anyị amaghị ihe niile gbasara Jona, anyị nwere ike iche na ọ bụ onye a na-agaghị atụkwasịli obi ma ọ bụdị onye nnupụisi. Jehova nyere ya iwu ka ọ gaa gwa ndị Ninive na ọ ga-ebibi ha. Kama irubere Jehova isi, ọ banyere ụgbọ na-aga ebe ọzọ ka ọ “gbapụ n’ihu Jehova.” (Jona 1:1-3) Ọ bụrụ gị, ị̀ gaara enye Jona ohere ọzọ ka ọ gaa zie ndị Ninive ozi ahụ? O nwere ike ị gaghị eme otú ahụ. Ma, Jehova kpebiri inye ya ohere ọzọ. (Jona 3:1, 2) Ekpere Jona kpere mere ka a mata ụdị onye ọ bụ. (Jona 2:1, 2, 9) Ekpere ahụ o kpere n’afọ azụ̀, nke o doro anya na ọ bụ otu n’ime ọtụtụ ekpere ndị Jona kpere, mere ka anyị ghara ịmara ya ka naanị onye gbaara ọrụ e nyere ya ọsọ. Ihe ndị o kwuru n’ekpere ahụ gosiri na ọ dị umeala n’obi, na obi dị ya ụtọ n’ihi ihe ọma Chineke meere ya, nakwa na o kpebisiri ike irubere Jehova isi. Ka a sịkwa ihe mere na Jehova elekwasịghị anya n’ihe o mejọrọ. Kama, ọ zara ekpere ya, kwekwa ka ọ ka bụrụ onye amụma. Ihe a gosiri na ọ dị ezigbo mkpa ka okenye ọ bụla na-achọpụta otú ihe si mee tupu ya enye ndụmọdụ. w20.04 15 ¶4-6
Wenezdee, Nọvemba 2
Ha [na Pọl] nọ na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ . . . , na-akọwa ma jiri ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ọ dị mkpa ka Kraịst taa ahụhụ.—Ọrụ 17:2, 3.
Ndị Kraịst n’oge ndịozi kwetakwara ná nkụzi Ndị Kraịst, kwetekwa ka mmụọ nsọ nyere ha aka ịghọta Okwu Chineke. Ha mekwara nchọnchọ iji mee ka obi sie ha ike na ihe ndị a kụziiri ha si n’Akwụkwọ Nsọ. (Ọrụ 17:11, 12; Hib. 5:14) Ihe mere ka ha nwee okwukwe abụghị naanị n’ihi otú obi dị ha. Ihe mekwara ka ha na-efe Jehova abụghị naanị n’ihi na obi na-adị ha ụtọ ma ha na ụmụnna ha nọrọ. Kama, ihe mere ha ji nwee okwukwe bụ n’ihi na ha nwere “ezi ihe ọmụma nke Chineke.” (Kọl. 1:9, 10) Eziokwu dị n’Okwu Chineke anaghị agbanwe agbanwe. (Ọma 119:160) Dị ka ihe atụ, ha anaghị agbanwe ma nwanna mee anyị ihe ọjọọ ma ọ bụ mee mmehie dị oké njọ. Ha anaghịkwa agbanwe ma nsogbu bịara anyị. N’ihi ya, eziokwu ndị Baịbụl na-akụzi kwesịrị ido anyị anya, obi esiekwa anyị ike na ha bụ eziokwu. Ọ bụrụ na okwukwe anyị nwere n’eziokwu ndị dị na Baịbụl abụrụ a kwaa a kwụrụ, ọ ga-eme ka anyị kwụsie ike ma nsogbu bịara anyị otú ahụ arịlịka si eme ka ụgbọ mmiri kwụsie ike mgbe ajọ ifufe na-efe. w20.07 9 ¶6-7
Tọzdee, Nọvemba 3
O [nyere] anyị iwu ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na ịgba àmà nke ọma.—Ọrụ 10:42.
Jizọs na-ewere ya na ọ bụ ya ka anyị meere ihe ọ bụla anyị meere ụmụnna ya e tere mmanụ. (Mat. 25:34-40) Ihe kacha mkpa anyị ga-eme iji kwado ha bụ ịna-eme ike anyị niile n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eme. (Mat. 28:19, 20) Naanị ihe ga-eme ka ụmụnna Kraịst kwusachaa ozi ọma a ha na-ekwusa n’ụwa niile ugbu a bụ ma “atụrụ ọzọ” ahụ nyere ha aka. (Jọn 10:16) Ọ bụrụ na i so n’atụrụ ọzọ ahụ, mgbe ọ bụla ị na-ekwusa ozi ọma, ị na-egosi na ị hụrụ ndị e tere mmanụ n’anya, hụkwa Jizọs n’anya. Anyị na Jehova na Jizọs ga-abụkwa enyi ma ọ bụrụ na anyị ejiri ego anyị na-enye onyinye maka ọrụ ha na-ahazi. (Luk 16:9) Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike inye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ. E ji onyinye ndị ahụ na-agbatakwara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. Anyị nwekwara ike inye onyinye iji kwụọ ụgwọ ihe a na-emefu n’ọgbakọ anyị, nyekwara ndị anyị ma ihe na-esiri ike aka.—Ilu 19:17 w20.04 24 ¶12-13
Fraịdee, Nọvemba 4
Ọ gaghị eji Chi ndị nna nna ya kpọrọ ihe. . . . Ma ọ ga-anọ n’ọkwá ya nye chi nke ebe dị iche iche e wusiri ike otuto.—Dan. 11:37, 38.
Gịnị ka eze ugwu ahụ mere nke gosiri na o jighị “Chi ndị nna nna ya kpọrọ ihe”? Ọchịchị Sọviet Yuniọn kpebiri ikpochapụ okpukpe niile. N’ihi ya, ọ gbalịrị ime ka okpukpe ndị dị kemgbe ụwa ghara inwe ọnụ. Iji mezuo ihe a, kemgbe afọ 1918, ọchịchị Sọviet Yuniọn nyere iwu mere e ji bido ịkụziri ụmụ akwụkwọ na Chineke adịghị. Olee otú eze ugwu si “nye chi nke ebe dị iche iche e wusiri ike otuto”? O mefuru ego buru ibu n’ịzụ ndị agha ya, n’ime ka ndị agha ya bukwuo ibu, nakwa n’imepụta ngwá agha ọgwụrụ mba iji mee ka ọchịchị ya sikwuo ike. Ma eze ugwu ma eze ndịda mechara nweta ngwá agha ga-enwe ike igbu ọtụtụ ijeri mmadụ. E nwere otu ihe gbara ọkpụrụkpụ eze ugwu na eze ndịda jikọrọ aka mee. Ha hiwere “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu,” ya bụ, Òtù Mba Ụwa.—Dan. 11:31. w20.05 6 ¶16-17
Satọdee, Nọvemba 5
Nwanne gị nwoke . . . fukwara efu, e wee chọta ya.—Luk 15:32.
Ole ndị kwesịrị iso nye aka na-achọ ndị hapụrụ ọgbakọ? Anyị niile, ma ndị okenye, ndị ọsụ ụzọ, ndị ezinụlọ onye ahụ na ndị nkwusa niile nọ n’ọgbakọ. È nwere enyi gị ma ọ bụ onye ezinụlọ unu na-adịghị ejekwa ozi? È nweela onye na-adịghị ejekwa ozi ị hụrụ mgbe ị na-eje ozi ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ mgbe ị na-ekwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị? Gwa onye ahụ na ọ bụrụ na ọ chọrọ ka mmadụ bịa na nke ya, ị ga-achọ inye ndị okenye ọgbakọ unu adres ya ma ọ bụ akara ekwentị ya. Otu okenye aha ya bụ Thomas kwuru, sị: “Ihe mbụ m na-eme bụ ịjụ ụmụnna ma hà ma ebe ụmụnna ndị kwụsịrịla ije ozi bi ugbu a, ma ọ bụkwanụ mụ ajụọ ha ma è nwere onye ha chetara na-anaghịzi abịa ọmụmụ ihe. M gaa na nke onye nkwusa kwụsịrịla ije ozi, m na-ajụ ya maka ụmụ ya na ndị ezinụlọ ya ndị ọzọ. Ụfọdụ n’ime ha na-akpọbu ụmụ ha abịa ọmụmụ ihe. O nwekwara ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ụmụ ha ndị ahụ bụbu ndị nkwusa. E nwekwara ike inyere ha aka ịlọghachikwute Jehova.” w20.06 24 ¶1; 25 ¶6-7
Sọnde, Nọvemba 6
M ga-echeta ihe niile Jaa mere; n’ihi na m ga-echeta ihe dị ịtụnanya i mere n’oge dị anya gara aga.—Ọma 77:11.
N’ime ihe niile e kere eke dị n’ụwa, ọ bụ naanị ụmụ mmadụ nwere ike icheta ihe na ichebara ihe ahụ echiche ma si na ya mụta ihe. Ọ bụ ihe a mere anyị ji enwe ike ịmụta ịkpa àgwà ọma na ịgbanwe otú anyị si eche echiche na otú anyị si ebi ndụ. (1 Kọr. 6:9-11; Kọl. 3:9, 10) N’eziokwu, anyị nwere ike ịzụ akọnuche anyị ka ọ na-amata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ. (Hib. 5:14) Anyị nwere ike ịmụta ịhụ ndị mmadụ n’anya, inwere ha ọmịiko, na imere ha ebere. Anyị nwekwara ike ịmụta ikpe ikpe ziri ezi ka Jehova. Otu ụzọ anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ịna-echeta ihe bụ anyị ịna-echeta oge niile Jehova nyeere anyị aka ma kasie anyị obi. Ọ ga-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-enyere anyị aka n’ọdịnihu. (Ọma 77:12; 78:4, 7) Otú ọzọ anyị nwere ike isi mee ya bụ ịna-echeta ihe ọma ndị ọzọ meere anyị na igosi ha na obi dị anyị ụtọ maka ya. Ndị na-eme nchọnchọ kwuru na ndị obi na-atọ ụtọ maka ihe ọma e meere ha na-enwekarị obi ụtọ. w20.05 23 ¶12-13
Mọnde, Nọvemba 7
Tụọ egwu aha a nke dị ebube ma dị egwu, bụ́ Jehova Chineke gị.—Diut. 28:58.
Chegodị otú obi dị Mozis mgbe ọ nọ n’otu ọgba dị n’oké nkume ma hụ ọhụụ ka ebube Jehova na-agafe. Ihe a bụ ihe kacha dị ebube mmadụ hụtụrụla tupu Jizọs abịa n’ụwa. Mozis nụrụ ka Jehova na-agwa ya okwu. Ọ ga-abụ na o si n’ọnụ mmụọ ozi gwa ya, sị: “Jehova, Jehova, Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu, onye na-eme ka obiọma ya ruoro ọtụtụ puku ọgbọ, na-agbaghara njehie na mmebi iwu na mmehie.” (Ọpụ. 33:17-23; 34:5-7) Ọ ga-abụ na Mozis na-echeta ihe ahụ merenụ mgbe ọ kpọrọ aha Jehova mgbe ọ na-ekwu ihe dị n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Anyị chewe banyere aha ahụ bụ́ Jehova, anyị kwesịkwara iche banyere ụdị onye Jehova bụ. Anyị kwesịrị icheta àgwà ya ndị dị ka, ike, amamihe, ikpe ziri ezi, na ịhụnanya. Iche gbasara àgwà ya ndị a na àgwà ya ndị ọzọ nwere ike ime ka anyị na-akwanyekwuru ya ùgwù.—Ọma 77:11-15. w20.06 8-9 ¶3-4
Tuzdee, Nọvemba 8
Nọgide n’ihe ndị ị mụtara, ndị e mekwara ka i kwere.—2 Tim. 3:14.
Ihe a ejughị anyị anya n’ihi na Jizọs kwuru na ihe a ga-eji mara ndị na-eso ụzọ ya bụ na ha ga-ahụ ibe ha n’anya. (Jọn 13:34, 35) Ma, e nwekwara ihe ndị ọzọ anyị kwesịrị ime ka okwukwe anyị sie ike. Ọ bụghị naanị otú ndị Chineke si hụ ibe ha n’anya kwesịrị ime ka anyị nwee okwukwe. N’ihi gịnị? Ka e were ya na nwanna, ọ bụrụgodị okenye ma ọ bụ ọsụ ụzọ, mere mmehie dị oké njọ, ma ọ bụ na nwanna mere gị ihe na-adịghị mma, ma ọ bụkwanụ na e nwere nwanna dapụrụ n’ọgbakọ ma na-ekwu na ihe anyị kweere abụghị eziokwu. Ụdị ihe ndị a mee, ị̀ ga-asụ ngọngọ ma kwụsị ife Jehova? Ihe anyị na-amụta bụ: Ọ bụrụ na ihe mere i ji nwee okwukwe na Chineke bụ naanị maka otú ndị ọzọ si akpa àgwà kama ịbụ na gị na Chineke dị ná mma, okwukwe gị agaghị esi ike. Otú i si hụ Jehova na ndị ya n’anya nwere ike inyetụrụ gị aka inwe okwukwe. Ma, ọ dịkwa ezigbo mkpa ka ị mụọ Baịbụl nke ọma, ghọta ihe ị na-amụ, meekwa nchọnchọ ka o doo gị anya na ihe ị na-amụta gbasara Jehova bụ eziokwu. Obi kwesịrị isi gị ike na ihe Baịbụl na-akụzi gbasara Jehova bụ eziokwu.—Rom 12:2. w20.07 8 ¶2-3
Wenezdee, Nọvemba 9
[Na-enyere] ndị na-adịghị ike aka.—Ọrụ 20:35.
E nwere ọtụtụ akụkọ mere eme gosiri na ndị mmụọ ozi na-enyere anyị aka ịchọta ndị na-adịghị ejekwa ozi chọrọ ịlọghachikwute Jehova. (Mkpu. 14:6) Dị ka ihe atụ, otu nwanna aha ya bụ Silvio bi n’Ekwedọ kpesiri ekpere ike ka Jehova nyere ya aka ịlọghachi n’ọgbakọ. Ka ọ nọ na-ekpe ekpere, ndị okenye abụọ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ya. Obi dị ha ụtọ inyewere ya aka. Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ ma anyị nyere ndị hapụrụ Jehova aka ịlọghachikwute ya. Legodị ihe otu ọsụ ụzọ na-agbalịsi ike inyere ndị na-adịghị ejekwa ozi aka aha ya bụ Salvador kwuru. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, obi ụtọ m na-enwe maka ndị na-adịghi ejekwa ozi lọghachiri n’ọgbakọ na-eme ka anya mmiri gbawa m. Obi na-adị m ụtọ na Jehova ji m na-enyere ndị ohu ya aka isi n’ụwa Setan a pụta ma lọghachi n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ị naghịzi aga ọmụmụ ihe na ozi ọma, obi sie gị ike na Jehova ka hụrụ gị n’anya. Jehova na-atụ anya ka ị lọghachi. Ọ ga-eji obi ụtọ nabatakwa gị. w20.06 29 ¶16-18
Tọzdee, Nọvemba 10
Anya gị ga-aghọ anya na-ahụ Onye Ozizi Ukwu gị.—Aịza. 30:20.
Ebe Jehova bụ “Onye Ozizi Ukwu” anyị, o dere gbasara ndị ụfọdụ n’Okwu ya iji kụziere anyị ihe. (Aịza. 30: 21) Ọ bụrụ na anyị na-eche gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, anyị ga-amụta otú anyị ga-esi na-akpa àgwà ndị na-eme Chineke obi ụtọ. Anyị ga-amụtakwa ihe n’ihe mere ndị na-akpaghị àgwà ndị na-eme Chineke obi ụtọ. (Ọma 37:37; 1 Kọr. 10:11) Chegodị gbasara ihe mere Eze Sọl. Mgbe ọ bụ nwa okorobịa, ọ ma ebe ike ya ruru. Ọ chọghịdị ka e nyekwuo ya ọrụ. (1 Sam. 9:21; 10:20-22) Ma ka oge na-aga, Sọl malitere ịdị mpako. Ọ malitere ịkpa àgwà ọjọọ a obere oge ọ ghọchara eze. N’otu oge, o nweghị ndidi chere Samuel onye amụma ma chụọrọ Jehova àjà n’agbanyeghị na ọ bụghị ọrụ ya. N’ihi ya, Jehova jụrụ ya, mechaakwa mee ka ọ gharazie ịbụ eze. (1 Sam. 13:8-14) Ọ bụrụ na anyị amụta ihe n’ihe a mere Sọl ma mara ebe ike anyị ruru, anyị ga-abụ ndị maara ihe. w20.08 10 ¶10-11
Fraịdee, Nọvemba 11
Na-akwanyere ndị . . . na-elekọta unu n’ime Onyenwe anyị ùgwù.—1 Tesa. 5:12.
Ọ bụ eziokwu na Jehova si n’aka Jizọs nye ọgbakọ ya “onyinye n’ụdị mmadụ.” (Efe. 4:8) Ndị so ‘n’onyinye n’ụdị mmadụ’ ahụ bụ ndị so n’Òtù Na-achị Isi, ndị na-enyere ha aka, ndị so na Kọmitii Alaka, ndị nlekọta sekit, ndị na-akụzị ihe n’ụlọ akwụkwọ Òtù Na-achị Isi haziri, ndị okenye, na ndị ohu na-eje ozi. E ji mmụọ nsọ họpụta ụmụnna ndị a ka ha na-elekọta atụrụ Chineke ma na-enyere ọgbakọ aka. (1 Pita 5:2, 3) A na-eji mmụọ nsọ ahọpụta ụmụnna nwoke ka ha na-arụ ọrụ dị iche iche n’ọgbakọ. Otú ahụ akụkụ ahụ́ dị iche iche, dị ka aka na ụkwụ, na-arụ ọrụ na-abara ahụ́ niile uru, ụmụnna nwoke ndị a e ji mmụọ nsọ họpụta na-arụ ọrụ na-abara ọgbakọ niile uru. Ha anaghị achọ ka ndị ọzọ too ha. Kama nke ahụ, ha na-agbalị ilekọta ụmụnna ha ma na-eme ka ha dị ike. (1 Tesa. 2:6-8) Anyị na-ekele Jehova maka inye anyị ụmụnna nwoke ndị a ruru eru na-anaghị achọ ọdịmma nke naanị ha. w20.08 21 ¶5-6
Satọdee, Nọvemba 12
Gaanụ . . . mee ndị na-eso ụzọ.—Mat. 28:19, 20.
Otu ihe mere anyị ji enwe mmasị ikwusa ozi ọma bụ na ‘a gbara ndị mmadụ akpụkpọ, na-achụsakwa ha.’ Ọ dịkwa ha ezigbo mkpa ịnụ ozi ọma Alaeze Chineke. (Mat. 9:36) Jehova chọrọ ka ụdị mmadụ niile nweta ezi ihe ọmụma nke eziokwu nakwa ka a zọpụta ha. (1 Tim. 2:4) Ọ bụrụ na anyị echee gbasara otú ozi ọma anyị nwere ike isi zọpụta ndị mmadụ, ọ ga-eme ka anyị nwee mmasị ikwusa ozi ọma. Anyị na-enyere ndị mmadụ aka ka e nwee ike ịzọpụta ha. (Rom 10:13-15; 1 Tim. 4:16) Anyị kwesịkwara inwe ngwá ọrụ dị mma anyị ji ezi ozi ọma, marakwa otú e si eji ya ezi ozi ọma. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya hoo haa otú ha ga-esi na-akụta ndị mmadụ. Ọ gwara ha ihe ha na-agaghị eji aga, ebe ha ga-aga, na ihe ha ga-ekwu. (Mat. 10:5-7; Luk 10:1-11) Taa, nzukọ Jehova emepụtarala anyị ọtụtụ ngwá ọrụ e ji akụzi Baịbụl. Ha dị n’ebe a na-akpọ, “Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe.” Nzukọ Jehova na-azụ anyị ka anyị mụta iji ha akụzi ihe nke ọma. Ọzụzụ a na-eme ka anyị mụta iji obi ike akụzi ihe na ịkụzi ihe nke ọma.—2 Tim. 2:15. w20.09 4 ¶6-7, 10
Sọnde, Nọvemba 13
Ọ dịghị ihe ọzọ ga-eme ka m nwee obi ekele karịa ihe a, ya bụ, na m ga na-anụ na ụmụ m na-eje ije n’eziokwu ahụ.—3 Jọn 4.
Ì nwere ike iche ụdị obi ụtọ Jọn onyeozi nwere mgbe ọ nụrụ na ndị o nyeere aka ịmụta eziokwu ka ji obi ha niile na-efe Jehova? Ọtụtụ nsogbu bịaara ha. Jọn gbasiri mbọ ike ime ka okwukwe ndị a ji obi ha niile na-efe Jehova, ndị o wekwaara ka ụmụ ya, sie ike. Obi na-atọkwa anyị ụtọ ma ụmụ anyị ma ọ bụ ndị anyị nyeere aka ịmata eziokwu nyefee Jehova onwe ha ma nọgide na-efe ya. (3 Jọn 3) N’ihe dị ka afọ 98, mmụọ nsọ Jehova mere ka Jọn dee akwụkwọ ozi atọ. Ihe mere o ji dee ha bụ iji ha mee ka okwukwe Ndị Kraịst ji obi ha na-efe Chineke sie ike na Jizọs nakwa ka ha nọgide na-eje ije n’eziokwu. Ihe nọ na-eme Jọn ụra aga n’anya bụ otú ndị ozizi ụgha si na-achọ imegharị ndị nọ n’ọgbakọ anya. (1 Jọn 2:18, 19, 26) Ndị ahụ si n’ezi ofufe dapụ na-azọrọ na ha maara Chineke, ma ha anaghị edebe iwu Chineke. w20.07 20 ¶1-3
Mọnde, Nọvemba 14
Nweenụ okwukwe n’ebe Chineke nọ, nweekwanụ okwukwe n’ebe mụ onwe m nọ.—Jọn 14:1.
Anyị nwee okwukwe n’ozi anyị na-ezi ndị mmadụ, ọ ga-eme ka anyị na-agbalịsi ike izi ya onye ọ bụla anyị hụrụ. Anyị kwetasiri ike ná nkwa ndị Chineke kwere anyị n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. (Ọma 119:42; Aịza. 40:8) Anyị na-ahụ ka amụma Baịbụl na-emezu n’oge anyị a. Anyị ahụla otú ndụ ndị mmadụ si ka mma mgbe ha malitere ime ihe Baịbụl kwuru. Ihe a na-eme ka obi sikwuo anyị ike na ozi ọma Alaeze Chineke bụ ozi onye ọ bụla kwesịrị ịnụ. Anyị nwekwara okwukwe n’ebe Jehova nọ, onye ozi anyị na-ekwusa si n’aka. Anyị nwekwara okwukwe n’ebe Eze ọ họpụtara bụ́ Jizọs nọ. N’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị, Jehova ga-anọgide na-abụ ike anyị na ebe mgbaba anyị. (Ọma 46:1-3) Ihe ọzọ bụ na obi siri anyị ike na Jizọs nọ n’eluigwe jiri ikike Jehova nyere ya na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma anyị na-arụ. (Mat. 28:18-20) Okwukwe na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-agọzi mbọ anyị na-agba. w20.09 12 ¶15-17
Tuzdee, Nọvemba 15
O meere m ihe ọma. . . . O mere ihe o nwere ike ime.—Mak 14:6, 8.
Mgbe ụfọdụ, ụmụnna nwaanyị nwee nsogbu, ha nwere ike ịchọ onye ga-agbachitere ha. (Aịza. 1:17) Dị ka ihe atụ, nwanna nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ onye ya na di ya gbara alụkwaghịm nwere ike ịchọ onye ga na-enyere ya aka eme ihe ndị di ya na-emeburu ya. Nwanna nwaanyị mere agadi nwere ike ịchọ onye ga-agwara ya dọkịta okwu. Nwanna nwaanyị na-asụ ụzọ ma na-arụ ọrụ ndị ọzọ ná nzukọ Jehova nwere ike ịchọ onye ga-agbachitere ya ma ndị ọzọ na-akatọ ya na ọ naghị apụta ozi ka ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ. Ka anyị tụlee ihe ọzọ Jizọs mere. Jizọs egbughị oge ịgbachitere ụmụ nwaanyị ndị jeere Jehova ozi mgbe ndị ọzọ ghọtahiere ha. Dị ka ihe atụ, ọ gbachiteere Meri mgbe Mata katọrọ ya. (Luk 10:38-42) Ọ gbachitekwaara Meri nke ugboro abụọ ya mgbe ndị ọzọ katọrọ ya mgbe o mere ihe ha chere na ọ dịghị mkpa. (Mak 14:3-9) Jizọs ma ihe Meri bu n’obi ma jaa ya mma. Jizọs kwudịrị na a ga na-ekwu banyere ihe a o mere “n’ebe ọ bụla a na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ụwa dum.” w20.09 24 ¶15-16
Wenezdee, Nọvemba 16
Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta, ọ bụghị ná mmanye, kama jirinụ obi unu na-azụ ha.—1 Pita 5:2.
Ezigbo onye ọzụzụ atụrụ ma na atụrụ ya nwere ike ịkpafu. Ọ bụrụ na e nwee atụrụ kpafurunụ, onye ọzụzụ atụrụ anaghị ata ya ahụhụ. Ka anyị tụlee otú Jehova si nyere ụfọdụ ndị kwụsịtụrụ ife ya n’oge ochie aka na ihe anyị ga-amụta na ya. Jona onye amụma gbaara ọrụ Jehova nyere ya ọsọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova ajụghị ya. Dị ka ezigbo onye ọzụzụ atụrụ, Jehova zọpụtara ya ma nyere ya aka inweta ume ọ ga-eji rụọ ọrụ ahụ o nyere ya. (Jona 2:7; 3:1, 2) Ka oge na-aga, Chineke ji osisi ogiri ụgba nyere Jona aka ịghọta otú o si were ndụ mmadụ. (Jona 4:10, 11) Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ndị okenye ekwesịghị ikpebi ozugbo na ndị na-anaghị ejekwa ozi agaghị agbanweli. Kama, ha na-agbalị ịghọta ihe mere ha ji kpafuo. Ọ bụrụkwa na ha alọghachi n’ọgbakọ, ndị okenye kwesịrị ịna-egosi ha na ha hụrụ ha n’anya. w20.06 20-21 ¶10-12
Tọzdee, Nọvemba 17
A ga-enyetụrụ ha aka.—Dan. 11:34.
Mgbe Sọviet Yuniọn dachara n’afọ 1991, ‘e nyetụụrụ’ ndị Chineke nọ n’ebe ahụ aka, ya bụ, ha nweretụụrụ onwe ha. N’ihi ya, ha nweere onwe ha ikwusa ozi ọma. Ọ dịghị anya, ndị nkwusa e nwere ná mba ọchịchị Kọmunist na-achị eruo ọtụtụ narị puku. Ka oge na-aga, Rọshịa na mba ndị na-akwado ya ghọrọ eze ugwu. E nwere ihe atọ e ji amata ọchịchị bụ́ eze ugwu ma ọ bụ eze ndịda. Ha bụ: (1) ọ ga-emegide ndị na-efe Chineke, (2) otú o si emeso ndị na-efe Chineke ga-egosi na ọ kpọrọ Jehova na ndị ya asị, nakwa (3) ya na eze nke ọzọ ga na-amarịta aka. Rọshịa na mba ndị na-akwado ya na-emegide ndị Chineke. Ha machiri ọtụtụ puku ụmụnna anyị ikwusa ozi ọma, na-akpagbukwa ha. Ihe ndị a ha na-eme gosiri na ha kpọrọ Chineke na ndị ya asị. Ha na eze ndịda, bụ́ Briten na Amerịka, na-amarịtakwa aka. w20.05 12-13 ¶3-4
Fraịdee, Nọvemba 18
Na-elezi . . . ozizi gị anya mgbe niile.—1 Tim. 4:16.
Ebe ọ bụ na izi ihe na ime ndị na-eso ụzọ na-aga ụkwụ na ụkwụ, anyị kwesịrị ime ka otú anyị si ezi ihe bụrụ ịgba. Anyị na-akụziri ọtụtụ nde mmadụ eziokwu ndị dị na Baịbụl n’ụwa niile. Ebe ọ bụ na ihe anyị si n’Okwu Chineke na-akụziri ndị mmadụ na-atọgbu anyị atọgbu, o nwere ike ime ka anyị chọọ iji ọnụ anyị kwuchaa ihe niile. N’ihi ya, ma ànyị na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ, ma ọ bụkwanụ na-eduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụlọ ha, anyị ekwesịghị ịna-ekwu ọtụtụ okwu. Onye na-amụrụ mmadụ Baịbụl ekwesịghị ịna-ekwu ọtụtụ okwu. O kwesịrị ịhapụ ka ọ bụrụ Baịbụl ga-akụziri onye ahụ ihe. O kwesịghịkwa ịna-achọ ịkọwacha ihe niile ọ maara banyere otu amaokwu Baịbụl ma ọ bụ isiokwu ha na-amụ. (Jọn 16:12) Chegodị banyere ihe ndị ị maara na Baịbụl tupu gị emee baptizim na ihe ndị ị maara ugbu a. O yikarịrị ka ihe ị ma mgbe i mere baptizim ọ̀ bụ eziokwu ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi. (Hib. 6:1) O weela gị ọtụtụ afọ iji mata ihe ndị ị ma ugbu a. N’ihi ya, achọla ka ị kụzichaara onye ị na-amụrụ Baịbụl ihe niile ị ma otu mgbe. w20.10 14-15 ¶2-4
Satọdee, Nọvemba 19
Onye a ọ́ bụghị ọkwá nkà ahụ, nwa Meri.—Mak 6:3.
Jehova họọrọ di na nwunye e ji ama atụ ka ọ bụrụ ha ga-amụ Jizọs. (Mat. 1:18-23; Luk 1:26-38) Ihe ndị e dere na Baịbụl Meri ji obi ya niile kwuo gosiri na ọ hụrụ Jehova na Okwu ya n’anya. (Luk 1:46-55) Ihe Josef mere mgbe Jehova gwara ya ihe ọ ga-eme gosikwara na ọ na-atụ egwu Chineke, na-emekwa uche ya. (Mat. 1:24) Ị̀ chọpụtara na Jehova ahọrọghị ndị bara ọgaranya ka ha bụrụ nne na nna Jizọs? Ihe Josef na Meri ji chụọ àjà mgbe a mụchara Jizọs gosiri na ha dara ogbenye. (Luk 2:24) Ọ ga-abụrịrị na ha mere ka ndụ ha dị mfe, karịchaa mgbe ha bịara mụọ ihe ruru ụmụ asaa. (Mat. 13:55, 56) Jehova chebere Jizọs ka ọ ghara ịdaba ná nsogbu ụfọdụ. Ma, o chebeghị ya ka nsogbu ghara ịbịara ya chaa chaa. (Mat. 2:13-15) Dị ka ihe atụ, ndị ikwu ya ụfọdụ anaghị efe Chineke. Ha ekwetaghị na ọ bụ ya bụ Mesaya ná mmalite. (Mak 3:21; Jọn 7:5) Ọ ga-abụkwa na nna Jizọs bụ́ Josef nwụrụ, Jizọs eruo uju ya. w20.10 26-27 ¶4-6
Sọnde, Nọvemba 20
M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.—Hib. 13:5.
È nwetụla mgbe ọ dị gị ka ị̀ nọ naanị gị, ya adịkwa gị ka e nweghị onye ga-enyere gị aka ná nsogbu ndị na-abịara gị? E nweela ọtụtụ ndị ọ dị otú ahụ, ma ndị na-efe Jehova. (1 Eze 19:14) Ọ bụrụ na ụdị ihe a emetụla gị, cheta nkwa Jehova kwere. Ọ sịrị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” N’ihi ya, anyị nwere ike iji obi ike sị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu.” (Hib. 13:5, 6) Ọ bụ ụmụnna ndị nọ na Judia ka Pọl onyeozi gwara okwu ndị a n’ihe dị ka n’afọ 61. Ihe a ọ gwara ha na-echetara anyị ihe e kwuru n’Abụ Ọma 118:5-7. Dị ka ọbụ abụ ahụ, Pọl si n’ihe ndị mere ya mata na Jehova bụ Onye na-enyere ya aka. Dị ka ihe atụ, ihe karịrị afọ abụọ tupu Pọl edegara ndị Hibru akwụkwọ ozi, Jehova napụtara ya mgbe oké ifufe fere n’oge ọ nọ n’ụgbọ mmiri na-eme njem. (Ọrụ 27:4, 15, 20) Tupu Pọl emee njem ahụ nakwa n’oge ọ na-eme njem ahụ, Jehova si n’ọtụtụ ụzọ nyere ya aka. w20.11 12 ¶1-2
Mọnde, Nọvemba 21
Asịla: “Gịnị mere oge gara aga ji dị mma karịa oge a?”—Ekli. 7:10.
Gịnị mere na ọ dịghị mma ka anyị na-eche na otú ihe si dịrị anyị na mbụ ka mma karịa otú o si dịrị anyị ugbu a? Mmadụ ịchọ ka ihe dịrị ya otú ọ dịịrị ya na mbụ nwere ike ime ka onye ahụ na-echeta naanị ihe ọma ndị meere ya n’oge gara aga. Ka anyị tụlee gbasara ụmụ Izrel oge ochie. Ozugbo ha si n’Ijipt pụta, ha chefuru otú ihe si siere ha ike mgbe ahụ. Naanị ihe ha na-echetazi bụ nri ọma ha nọ na-eri mgbe ahụ. Ha sịrị: “Anyị na-echeta azụ̀ anyị na-ata n’Ijipt n’efu, tinyere kukumba na wọtamelọn na lik na yabaasị na galik!” (Ọnụ Ọgụ. 11:5) Ma ọ̀ bụ eziokwu na ha nọ na-eri ihe ndị ahụ “n’efu”? Mba. Ụmụ Izrel tara ahụhụ maka ihe niile ahụ ha riri. N’oge ahụ, Ndị Ijipt ji ha mere ohu, na-echi ha ọnụ n’ala. (Ọpụ. 1:13, 14; 3:6-9) Ma ha mechara chefuo ahụhụ niile ahụ ha tara n’Ijipt, ha ebidokwa chọwa ka ihe dịrị ha otú ọ dịịrị ha n’Ijipt. Ha lekwasịrị anya n’ihe ọma ndị ha na-enweta n’ala Ijipt kama ilekwasị anya n’ihe ọma ndị Jehova na-emere ha ugbu a. Ihe a ha mere adịghị Jehova mma.—Ọnụ Ọgụ. 11:10. w20.11 25 ¶5-6
Tuzdee, Nọvemba 22
Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.—Ọma 34:18.
Ebe ọ bụ na ndụ anyị dị mkpụmkpụ, “jupụtakwa ná nsogbu,” o nwere ike ime ka anyị na-eche echiche mgbe ụfọdụ. (Job 14:1) Ihe a nwere ike ime ka anyị daa mbà n’obi mgbe ụfọdụ. Ọtụtụ ndị ohu Jehova n’oge ochie nwere mgbe ha dara mbà. E nwedịrị mgbe ụfọdụ n’ime ha chọrọ ịnwụ. (1 Eze 19:2-4; Job 3:1-3, 11; 7:15, 16) Ma n’oge ọ bụla ha dara mbà n’obi, Jehova, bụ́ Chineke ha tụkwasịrị obi, mesiri ha obi ike, meekwa ka ha dị ike. E dere akụkọ ha na Baịbụl ka ha kasie anyị obi ma kụziere anyị ihe. (Rom 15:4) N’otu ntabi anya, Josef si n’ịbụ nwa nna ya hụrụ n’anya gaa n’ịbụ ohu nwoke na-amaghị Chineke n’Ijipt. (Jen. 37:3, 4, 21-28; 39:1) Mgbe e mechara, nwunye Pọtịfa boro ya ebubo na ọ chọrọ idina ya n’ike. N’ebughị ụzọ mata nke bụ́ eziokwu, Pọtịfa tụbara Josef n’ụlọ mkpọrọ, ebe e ji agbụ ígwè kee ya. (Jen. 39:14-20; Ọma 105:17, 18) N’eziokwu, e nwere ezigbo ihe mere Josef ga-eji daa mbà n’obi. w20.12 16-17 ¶1-4
Wenezdee, Nọvemba 23
Ka e doo aha gị nsọ.—Mat. 6:9.
Jizọs kwuru na ihe a kwesịrị iso n’ihe ndị kacha mkpa anyị ga-ekpe ekpere maka ha. Ma, gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara? Ido ihe nsọ pụtara ime ka ọ dị ọcha. Ụfọdụ nwere ike ịna-eche, sị, ‘Ọ̀ bụ na aha Jehova adịghị nsọ?’ Iji zaa ajụjụ a, anyị kwesịrị iche gbasara ihe aha na-anọchi anya ya. Aha abụghị naanị ihe e dere ede ma ọ bụ kwuo ekwuo. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dị mma ịhọrọ ezi aha karịa ịhọrọ akụ̀ dị ukwuu.” (Ilu 22:1; Ekli. 7:1) Gịnị mere aha ji dị mkpa otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọ na-anọchi anya ihe e ji mara mmadụ na ihe ndị mmadụ na-eche gbasara onye na-aza aha ahụ. N’ihi ya, ihe kacha mkpa abụghị otú e si ede aha mmadụ ma ọ bụ otú e si akpọ ya. Ihe kacha mkpa bụ onye nwe aha ahụ na ihe ndị mmadụ na-eche gbasara ya. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ana-ekwu ihe na-abụghị eziokwu gbasara Jehova, ihe ha na-eme bụ ime ka ndị mmadụ lewe ya anya ọjọọ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ elewe Chineke anya ọjọọ, ha na-ata ya ụta ma na-ekwutọ aha ya. w20.06 2-3 ¶5-7
Tọzdee, Nọvemba 24
Mkpụrụ obi m ezughị ike ma ọlị; Jehova—ọ̀ bụ ruo ole mgbe?—Ọma 6:3.
Nsogbu ndị kpụ ọkụ n’ọnụ nwere ike ime ka anyị na-echegbu onwe anyị. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị na anyị agaghị enweta ego ga-ezuru anyị igbo mkpa anyị, ma ọ bụ na ọrịa ga-eme ka anyị ghara ịna-aga ọrụ ma ọ bụkwanụ mee ka a chụọ anyị n’ọrụ. Anyị nwekwara ike ịna-echegbu onwe anyị na anyị nwere ike imebi iwu Chineke ma a nwaa anyị ọnwụnwa. N’oge na-adịghị anya, Ekwensu ga-eme ka ndị ọ na-achị bịa ịlụso ndị Chineke ọgụ. Anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị gbasara ihe anyị ga-eme ma ha bịa ịlụso anyị ọgụ. Anyị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ọ̀ dị njọ ma m na-eche gbasara ihe ndị a?’ Anyị ma na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu.” (Mat. 6:25) Ihe a ọ̀ pụtara na Jizọs anaghị atụ anya na anyị ga-echegbu onwe anyị gbasara ihe ọ bụla? Mba. A sị ka e kwuwe, ụfọdụ ndị fere Jehova n’oge ochie chegburu onwe ha gbasara ihe ụfọdụ. Nke a emeghịkwa ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma. (1 Eze 19:4) Ihe mere Jizọs ji kwuo ihe a bụ iji mee ka obi sie anyị ike. Ọ chọghị ka anyị kwe ka nchegbu maka ihe ndị e ji ebi ndụ kpaa ofufe anyị na-efe Jehova aka ọjọọ. w21.01 3 ¶4-5
Fraịdee, Nọvemba 25
Nwoke bụkwa isi nke nwaanyị.—1 Kọr. 11:3.
Ndị di ga-aza ma Jehova ma Jizọs ajụjụ maka otú ha si emeso ezinụlọ ha. (1 Pita 3:7) Ebe Jehova bụ Onyeisi ma ndị nọ n’eluigwe ma ndị nọ n’ụwa, o nwere ikike ịgwa ha otú ha ga-esi na-akpa àgwà, nweekwa ikike ịhụ na ha mere ihe ndị ahụ o kwuru. (Aịza. 33:22) Ebe ọ bụkwa Jizọs bụ onyeisi nke ọgbakọ, o nwere ikike inye ha iwu nakwa ịhụ na ha debere iwu ahụ. (Gal. 6:2; Kọl. 1:18-20) N’ezinụlọ Ndị Kraịst, onyeisi ezinụlọ nwere ikike ikpebi ihe a ga-eme n’ezinụlọ ya otú ahụ Jehova na Jizọs na-eme. (Rom 7:2; Efe. 6:4) Ma, ọ bụghị ihe niile ka o nwere ikike ime. Dị ka ihe atụ, iwu ya kwesịrị ịgbakwasị ụkwụ na Baịbụl. (Ilu 3:5, 6) Ma, onyeisi ezinụlọ enweghị ikike imere ndị na-abụghị ndị ezinụlọ ya iwu. (Rom 14:4) Ọ bụrụkwa na ụmụ ya etolite gaa biri nke ha, ha ka ga na-akwanyekwara ya ùgwù, ma ọ bụghị ya ga na-ekpebiri ha ihe ha ga-eme.—Mat. 19:5. w21.02 2-3 ¶3-5
Satọdee, Nọvemba 26
[Gbooro] ndị nke [gị] mkpa ha.—1 Tim. 5:8.
Otu ụzọ dị ezigbo mkpa onyeisi ezinụlọ ga-esi egosi na ọ hụrụ ezinụlọ ya n’anya bụ ịna-egboro ha mkpa ha. Ma, o kwesịrị icheta na naanị igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha agaghị eme ka ha na Chineke dịrị ná mma. (Mat. 5:3) Mgbe a kpọgidere Jizọs n’osisi ịta ahụhụ, ọ chọrọ ijide n’aka na e nwere onye ga-elekọta nne ya. N’agbanyeghị na Jizọs na ahụ́ ụfụ na-alụ n’oge ahụ, ọ gwara Jọn onyeozi ka ọ na-elekọta nne ya Meri. (Jọn 19:26, 27) E nwere ike inwe ọtụtụ ọrụ nwanna bụ́ onyeisi ezinụlọ na-arụ. Ọ ga na-arụsi ọrụ ike n’ebe ọ na-arụ ọrụ ka e nwee ike ito Jehova. (Efe. 6:5, 6; Taị. 2:9, 10) O nwekwara ike inwe ọrụ ọ na-arụ n’ọgbakọ, dị ka, ịgba ụmụnna ume na ịhazi ozi ọma. N’agbanyeghị ihe ndị a, ọ dị ezigbo mkpa ka ọ na-ewepụta oge ya na ndị ezinụlọ ya ga-eji na-amụ Baịbụl. Obi ga na-adị ha ụtọ maka mbọ ọ na-agba igboro ha mkpa ha, ime ha obi ụtọ, nakwa ime ka ha na Jehova dịrị ná mma.—Efe. 5:28, 29; 6:4. w21.01 12 ¶15, 17
Sọnde, Nọvemba 27
[Ezigbo nwaanyị] na-eleru anya n’ihe ndị na-eme n’ezinụlọ ya.—Ilu 31:27.
Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ ezigbo nwaanyị nwere ike ime n’ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịhazi ọrụ ndị dị n’ụlọ, zụọ ala ma ọ bụ ree ala, na-azụkwa ahịa. (Ilu 31:15, 16, 18) Nwaanyị abụghị ohu na-enweghị ọnụ n’ezinụlọ. Kama, di ya tụkwasịrị ya obi, na-egekwa ya ntị n’ihe ọ na-ekwu. (Ilu 31:11, 26) Ọ bụrụ na di esi otú ahụ na-emeso nwunye ya, ọ gaghị esiri nwunye ya ike ido onwe ya n’okpuru ya. N’agbanyeghị ihe ndị Jizọs merela, o cheghị na ido onwe ya n’okpuru Jehova bụ iwetu onwe ya ala. (1 Kọr. 15:28; Fil. 2:5, 6) Otú ahụ ka ọ dịkwa ezigbo nwaanyị chọrọ ime ka Jizọs. Ọ gaghị ewere ya na ido onwe ya n’okpuru di ya bụ iwetu onwe ya ala. Ihe ga-eme ka ọ na-akwado di ya abụghị naanị na ọ hụrụ ya n’anya. Kama, isi ihe mere ọ ga-eji eme ya bụ na ọ hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ịna-erubere ya isi. Nwunye bụ́ Onye Kraịst na-edo onwe ya n’okpuru di ya agaghị akwado di ya ma ọ gwa ya mebie iwu Chineke. w21.02 11 ¶14-15; 12 ¶19
Mọnde, Nọvemba 28
Mkpagbu na-arụpụta ntachi obi.—Rom 5:3.
Ịhụ Chineke n’anya na-enyere ndị na-efe Chineke aka mgbe niile idi mkpagbu. Dị ka ihe atụ, mgbe ụlọikpe kacha elu ndị Juu nyere ndịozi iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ịhụ Chineke n’anya mere ka ha “rubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29; 1 Jọn 5:3) Otú ụmụnna anyị si jiri obi ha niile hụ Chineke n’anya taa na-emekwa ka ha dị ike n’agbanyeghị na ndị ọchịchị aka ike na-emegide ọtụtụ n’ime ha. Kama ịda mbà, obi na-adị anyị ụtọ n’agbanyeghị asị ụwa kpọrọ anyị. (Ọrụ 5:41; Rom 5: 4, 5) Ndị ezinụlọ anyị imegide anyị nwere ike ịbụ otu n’ime ihe ndị kacha sie ike odidi. Ụfọdụ ndị ezinụlọ anyị chọpụta na anyị chọrọ ịmụ banyere Jehova, ha nwere ike ịna-eche na e megharịala anyị anya. Ndị ọzọ nwekwara ike ịna-eche na isi emebiela anyị. (Tụlee Mak 3:21.) Ha nwedịrị ike imesiwe anyị ike. Ụdị ihe a ekwesịghị iju anyị anya. Jizọs kwuru, sị: “Ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinụlọ ya.”—Mat. 10:36. w21.03 21 ¶6-7
Tuzdee, Nọvemba 29
Onye ọ bụla aghaghị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa.—Jems 1:19.
Ọ bụrụ na i soro nwanna gị gaa ịmụrụ mmadụ ihe, na-ege ntị nke ọma mgbe nwanna ahụ na onye ọ na-amụrụ ihe na-ekwu okwu. Ọ bụ ya ga-eme ka ị dịrị njikere inye aka n’oge kwesịrị ekwesị. Ma, i kwesịrị iche echiche tupu gị ekwuo okwu. Dị ka ihe atụ, i kwesịghị ikwu oké okwu ma ọ bụ napụ nwanna na-akụziri ya ihe okwu n’ọnụ mgbe ọ na-akọwara ya ihe ma ọ bụkwanụ kwuwe ihe ọzọ dị iche. Ma, i nwere ike ikwu obere okwu, jirikwa ihe atụ ma ọ bụ ajụjụ mee ka ihe a na-akụzi doo anya. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị gị ka e nweghị ezigbo ihe i nwere ike ikwu. Ma, ọ bụrụ na ị jaa onye ahụ a na-amụrụ ihe mma ma gosi na ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi, ọ ga-enyere ya aka ime nke ọma. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, i nwere ike ịkọtụrụ onye ahụ a na-amụrụ ihe otú i si mụta eziokwu, otú i si merie otu nsogbu, ma ọ bụkwanụ otú Jehova si nyere gị aka ná ndụ gị. (Ọma 78:4, 7) Ihe a nwere ike ịbụ ihe dị ya mkpa ịnụ n’oge ahụ. O nwere ike ime ka okwukwe ya sie ike ma ọ bụkwanụ gbaa ya ume ịnọgide na-eme nke ọma ka o nwee ike iru eru ime baptizim. w21.03 10 ¶9-10
Wenezdee, Nọvemba 30
Mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—Mat. 28:19.
Ònye ka anyị kwesịrị ikele maka ihe ọ bụla anyị rụzuru n’ozi ọma? Pọl zara ajụjụ ahụ n’ihe o dere gbasara ọgbakọ dị na Kọrịnt. Ọ sịrị: “Akụrụ m mkpụrụ, Apọlọs gbara ya mmiri, ma ọ bụ Chineke na-eme ka o too; nke mere na onye na-akụ mkpụrụ abụghị ihe ọ bụla, onye na-agba ya mmiri abụghịkwa ihe ọ bụla, kama ọ bụ Chineke onye na-eme ka o too bụ ihe niile.” (1 Kọr. 3:6, 7) Anyị kwesịrị ime ka Pọl, na-ekele Jehova maka ihe ọ bụla anyị rụzuru n’ozi ọma. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ na anyị na Chineke, Jizọs, na ndị mmụọ ozi ‘na-arụkọ ọrụ’? (2 Kọr. 6:1) Ọ bụ ma anyị na-eme ike anyị niile ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. Ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịkụ mkpụrụ nke eziokwu ahụ, anyị kwesịkwara ịna-agba ya mmiri. Ọ bụrụ na mmadụ enwee mmasị, anyị kwesịrị ịgba mbọ hụ na anyị gara mụwara ya Baịbụl. Ọ bụrụ na ọmụmụ ihe ahụ ana-aga nke ọma, obi ga-adị anyị ụtọ ịhụ otú Jehova si enyere ya aka ịgbanwe otú o si eche echiche. w20.05 30 ¶14, 16-18