Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
Akwukwo Igbo (1984-2023)
Pụọ
Banye
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Nnọọ.
Ihe a bụ ọ́bá akwụkwọ e ji eme nchọnchọ. O nwere akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova bipụtara n'ọtụtụ asụsụ.
Ị̀ chọọ ịdanlodu ihe, biko, gaa na jw.org.
Ịma Ọkwa
Asụsụ ndị ọhụrụ e tinyere: Lokaa
  • Taa

Tuzdee, Nọvemba 22

Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.​—Ọma 34:18.

Ebe ọ bụ na ndụ anyị dị mkpụmkpụ, “jupụtakwa ná nsogbu,” o nwere ike ime ka anyị na-eche echiche mgbe ụfọdụ. (Job 14:1) Ihe a nwere ike ime ka anyị daa mbà n’obi mgbe ụfọdụ. Ọtụtụ ndị ohu Jehova n’oge ochie nwere mgbe ha dara mbà. E nwedịrị mgbe ụfọdụ n’ime ha chọrọ ịnwụ. (1 Eze 19:​2-4; Job 3:​1-3, 11; 7:​15, 16) Ma n’oge ọ bụla ha dara mbà n’obi, Jehova, bụ́ Chineke ha tụkwasịrị obi, mesiri ha obi ike, meekwa ka ha dị ike. E dere akụkọ ha na Baịbụl ka ha kasie anyị obi ma kụziere anyị ihe. (Rom 15:4) N’otu ntabi anya, Josef si n’ịbụ nwa nna ya hụrụ n’anya gaa n’ịbụ ohu nwoke na-amaghị Chineke n’Ijipt. (Jen. 37:​3, 4, 21-28; 39:1) Mgbe e mechara, nwunye Pọtịfa boro ya ebubo na ọ chọrọ idina ya n’ike. N’ebughị ụzọ mata nke bụ́ eziokwu, Pọtịfa tụbara Josef n’ụlọ mkpọrọ, ebe e ji agbụ ígwè kee ya. (Jen. 39:​14-20; Ọma 105:​17, 18) N’eziokwu, e nwere ezigbo ihe mere Josef ga-eji daa mbà n’obi. w20.12 16-17 ¶1-4

Inyocha Akwụkwọ Nsọ—2022

Wenezdee, Nọvemba 23

Ka e doo aha gị nsọ.​—Mat. 6:9.

Jizọs kwuru na ihe a kwesịrị iso n’ihe ndị kacha mkpa anyị ga-ekpe ekpere maka ha. Ma, gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara? Ido ihe nsọ pụtara ime ka ọ dị ọcha. Ụfọdụ nwere ike ịna-eche, sị, ‘Ọ̀ bụ na aha Jehova adịghị nsọ?’ Iji zaa ajụjụ a, anyị kwesịrị iche gbasara ihe aha na-anọchi anya ya. Aha abụghị naanị ihe e dere ede ma ọ bụ kwuo ekwuo. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dị mma ịhọrọ ezi aha karịa ịhọrọ akụ̀ dị ukwuu.” (Ilu 22:1; Ekli. 7:1) Gịnị mere aha ji dị mkpa otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọ na-anọchi anya ihe e ji mara mmadụ na ihe ndị mmadụ na-eche gbasara onye na-aza aha ahụ. N’ihi ya, ihe kacha mkpa abụghị otú e si ede aha mmadụ ma ọ bụ otú e si akpọ ya. Ihe kacha mkpa bụ onye nwe aha ahụ na ihe ndị mmadụ na-eche gbasara ya. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ana-ekwu ihe na-abụghị eziokwu gbasara Jehova, ihe ha na-eme bụ ime ka ndị mmadụ lewe ya anya ọjọọ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ elewe Chineke anya ọjọọ, ha na-ata ya ụta ma na-ekwutọ aha ya. w20.06 2-3 ¶5-7

Inyocha Akwụkwọ Nsọ—2022

Tọzdee, Nọvemba 24

Mkpụrụ obi m ezughị ike ma ọlị; Jehova​—ọ̀ bụ ruo ole mgbe?​—Ọma 6:3.

Nsogbu ndị kpụ ọkụ n’ọnụ nwere ike ime ka anyị na-echegbu onwe anyị. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị na anyị agaghị enweta ego ga-ezuru anyị igbo mkpa anyị, ma ọ bụ na ọrịa ga-eme ka anyị ghara ịna-aga ọrụ ma ọ bụkwanụ mee ka a chụọ anyị n’ọrụ. Anyị nwekwara ike ịna-echegbu onwe anyị na anyị nwere ike imebi iwu Chineke ma a nwaa anyị ọnwụnwa. N’oge na-adịghị anya, Ekwensu ga-eme ka ndị ọ na-achị bịa ịlụso ndị Chineke ọgụ. Anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị gbasara ihe anyị ga-eme ma ha bịa ịlụso anyị ọgụ. Anyị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ọ̀ dị njọ ma m na-eche gbasara ihe ndị a?’ Anyị ma na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu.” (Mat. 6:25) Ihe a ọ̀ pụtara na Jizọs anaghị atụ anya na anyị ga-echegbu onwe anyị gbasara ihe ọ bụla? Mba. A sị ka e kwuwe, ụfọdụ ndị fere Jehova n’oge ochie chegburu onwe ha gbasara ihe ụfọdụ. Nke a emeghịkwa ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma. (1 Eze 19:4) Ihe mere Jizọs ji kwuo ihe a bụ iji mee ka obi sie anyị ike. Ọ chọghị ka anyị kwe ka nchegbu maka ihe ndị e ji ebi ndụ kpaa ofufe anyị na-efe Jehova aka ọjọọ. w21.01 3 ¶4-5

Inyocha Akwụkwọ Nsọ—2022
Nnọọ.
Ihe a bụ ọ́bá akwụkwọ e ji eme nchọnchọ. O nwere akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova bipụtara n'ọtụtụ asụsụ.
Ị̀ chọọ ịdanlodu ihe, biko, gaa na jw.org.
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2023 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya