Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
Akwukwo Igbo (1984-2023)
Pụọ
Banye
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Nnọọ.
Ihe a bụ ọ́bá akwụkwọ e ji eme nchọnchọ. O nwere akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova bipụtara n'ọtụtụ asụsụ.
Ị̀ chọọ ịdanlodu ihe, biko, gaa na jw.org.
Ịma Ọkwa
Asụsụ ndị ọhụrụ e tinyere: Lokaa
  • Taa

Tọzdee, Nọvemba 24

Mkpụrụ obi m ezughị ike ma ọlị; Jehova​—ọ̀ bụ ruo ole mgbe?​—Ọma 6:3.

Nsogbu ndị kpụ ọkụ n’ọnụ nwere ike ime ka anyị na-echegbu onwe anyị. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị na anyị agaghị enweta ego ga-ezuru anyị igbo mkpa anyị, ma ọ bụ na ọrịa ga-eme ka anyị ghara ịna-aga ọrụ ma ọ bụkwanụ mee ka a chụọ anyị n’ọrụ. Anyị nwekwara ike ịna-echegbu onwe anyị na anyị nwere ike imebi iwu Chineke ma a nwaa anyị ọnwụnwa. N’oge na-adịghị anya, Ekwensu ga-eme ka ndị ọ na-achị bịa ịlụso ndị Chineke ọgụ. Anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị gbasara ihe anyị ga-eme ma ha bịa ịlụso anyị ọgụ. Anyị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ọ̀ dị njọ ma m na-eche gbasara ihe ndị a?’ Anyị ma na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu.” (Mat. 6:25) Ihe a ọ̀ pụtara na Jizọs anaghị atụ anya na anyị ga-echegbu onwe anyị gbasara ihe ọ bụla? Mba. A sị ka e kwuwe, ụfọdụ ndị fere Jehova n’oge ochie chegburu onwe ha gbasara ihe ụfọdụ. Nke a emeghịkwa ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma. (1 Eze 19:4) Ihe mere Jizọs ji kwuo ihe a bụ iji mee ka obi sie anyị ike. Ọ chọghị ka anyị kwe ka nchegbu maka ihe ndị e ji ebi ndụ kpaa ofufe anyị na-efe Jehova aka ọjọọ. w21.01 3 ¶4-5

Inyocha Akwụkwọ Nsọ—2022

Fraịdee, Nọvemba 25

Nwoke bụkwa isi nke nwaanyị.​—1 Kọr. 11:3.

Ndị di ga-aza ma Jehova ma Jizọs ajụjụ maka otú ha si emeso ezinụlọ ha. (1 Pita 3:7) Ebe Jehova bụ Onyeisi ma ndị nọ n’eluigwe ma ndị nọ n’ụwa, o nwere ikike ịgwa ha otú ha ga-esi na-akpa àgwà, nweekwa ikike ịhụ na ha mere ihe ndị ahụ o kwuru. (Aịza. 33:22) Ebe ọ bụkwa Jizọs bụ onyeisi nke ọgbakọ, o nwere ikike inye ha iwu nakwa ịhụ na ha debere iwu ahụ. (Gal. 6:2; Kọl. 1:​18-20) N’ezinụlọ Ndị Kraịst, onyeisi ezinụlọ nwere ikike ikpebi ihe a ga-eme n’ezinụlọ ya otú ahụ Jehova na Jizọs na-eme. (Rom 7:2; Efe. 6:4) Ma, ọ bụghị ihe niile ka o nwere ikike ime. Dị ka ihe atụ, iwu ya kwesịrị ịgbakwasị ụkwụ na Baịbụl. (Ilu 3:​5, 6) Ma, onyeisi ezinụlọ enweghị ikike imere ndị na-abụghị ndị ezinụlọ ya iwu. (Rom 14:4) Ọ bụrụkwa na ụmụ ya etolite gaa biri nke ha, ha ka ga na-akwanyekwara ya ùgwù, ma ọ bụghị ya ga na-ekpebiri ha ihe ha ga-eme.​—Mat. 19:5. w21.02 2-3 ¶3-5

Inyocha Akwụkwọ Nsọ—2022

Satọdee, Nọvemba 26

[Gbooro] ndị nke [gị] mkpa ha.​—1 Tim. 5:8.

Otu ụzọ dị ezigbo mkpa onyeisi ezinụlọ ga-esi egosi na ọ hụrụ ezinụlọ ya n’anya bụ ịna-egboro ha mkpa ha. Ma, o kwesịrị icheta na naanị igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha agaghị eme ka ha na Chineke dịrị ná mma. (Mat. 5:3) Mgbe a kpọgidere Jizọs n’osisi ịta ahụhụ, ọ chọrọ ijide n’aka na e nwere onye ga-elekọta nne ya. N’agbanyeghị na Jizọs na ahụ́ ụfụ na-alụ n’oge ahụ, ọ gwara Jọn onyeozi ka ọ na-elekọta nne ya Meri. (Jọn 19:​26, 27) E nwere ike inwe ọtụtụ ọrụ nwanna bụ́ onyeisi ezinụlọ na-arụ. Ọ ga na-arụsi ọrụ ike n’ebe ọ na-arụ ọrụ ka e nwee ike ito Jehova. (Efe. 6:​5, 6; Taị. 2:​9, 10) O nwekwara ike inwe ọrụ ọ na-arụ n’ọgbakọ, dị ka, ịgba ụmụnna ume na ịhazi ozi ọma. N’agbanyeghị ihe ndị a, ọ dị ezigbo mkpa ka ọ na-ewepụta oge ya na ndị ezinụlọ ya ga-eji na-amụ Baịbụl. Obi ga na-adị ha ụtọ maka mbọ ọ na-agba igboro ha mkpa ha, ime ha obi ụtọ, nakwa ime ka ha na Jehova dịrị ná mma.​—Efe. 5:​28, 29; 6:4. w21.01 12 ¶15, 17

Inyocha Akwụkwọ Nsọ—2022
Nnọọ.
Ihe a bụ ọ́bá akwụkwọ e ji eme nchọnchọ. O nwere akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova bipụtara n'ọtụtụ asụsụ.
Ị̀ chọọ ịdanlodu ihe, biko, gaa na jw.org.
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2023 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya