-
“Kpọọ Ndị Okenye”Ụlọ Nche—1993 | Mee 15
-
-
18, 19. Òkè dị aṅaa ka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-ekere n’ihe banyere Ndị Galetia 6:2, 5?
18 Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye aghaghị ibu ibu ọrụ ha n’ebe ìgwè atụrụ Chineke nọ. Ha aghaghị ịbụ ndị na-enye nkwado. Dị ka ihe atụ, Pọl sịrị: “Ụmụnna m, a sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị mmụọ nsọ na-achị, meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ; na-elezi onwe gị anya, ka a ghara ịnwakwa gị onwe gị. Na-eburịtanụ ibu na-anyị ibe unu, na-edebezukwanụ iwu Kraịst n’ụzọ dị otú a.” Onyeozi ahụ dekwara, sị: “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.”—Ndị Galetia 6:1, 2, 5.
19 Olee ụzọ anyị pụrụ isi buo ibu na-anyịgbu ibe anyị ma na-ebukwa ibu nke onwe anyị? Ọdịiche dị n’ihe okwu Grik ndị ahụ pụtara ndị a sụgharịrị ịbụ “ibu na-anyị” na “ibu” na-ewepụta azịza ya. Ọ bụrụ na onye Kraịst abanye n’ihe isi ike ime mmụọ nke na-anyịgbu ya, ndị okenye na ndị kwere ekwe ibe ya ga-enyere ya aka, si otú a na-enyere ya aka ibu “ibu na-anyị” ya. Otú ọ dị, a tụrụ anya ka onye ahụ n’onwe ya na-ebu “ibu” ọrụ nke ya n’ebe Chineke nọ.a Ndị okenye na-eji ọṅụ na-ebu “ibu na-anyị” ụmụnna ha site n’agbamume, ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ, na ekpere. Ma, ndị okenye adịghị anapụ anyị “ibu” ọrụ ime mmụọ nke onwe anyị.—Ndị Rom 15:1.
-
-
“Kpọọ Ndị Okenye”Ụlọ Nche—1993 | Mee 15
-
-
a Akwụkwọ bụ́ A Linguistic Key to the Greek New Testament, nke Rienecker dere, kọwara phor·tiʹon dị ka “ibu nke a tụrụ anya ka mmadụ buo,” na-ekwukwa, sị: “E ji ya mee ihe dị ka okwu ndị agha maka akpa ibu mmadụ ma ọ bụ ihe onye agha ji kwanye ngwongwo ya.”
-