Abụ Ọma
א [Alef]
M ga-eji obi m dum too Jehova+
ג [Gimel]
ד [Dalet]
Ndị niile ọ na-atọ ụtọ na-echebara ya echiche.+
ה [Hee]
3 Ọrụ ya+ dị ebube, maakwa mma,+
ו [Wọọ]
Ezi omume ya na-adịrukwa mgbe ebighị ebi.+
ז [Zayin]
4 O mewo ihe a ga-eji na-echeta ọrụ ya dị ebube.+
ח [Het]
Jehova na-eme amara, na-emekwa ebere.+
ט [Tet]
5 Ọ na-enye ndị na-atụ egwu ya ihe oriri.+
י [Yod]
Ọ ga na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.+
כ [Kaf]
6 Ọ kọworo ndị ya banyere ike o ji rụọ ọrụ,+
ל [Lamed]
Site n’inye ha ihe nketa nke mba dị iche iche.+
מ [Mem]
7 Eziokwu na ikpe ziri ezi ka e ji mara ọrụ aka ya;+
נ [Nun]
Iwu ya niile bụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi,+
ס [Samek]
8 Ọ na-akwụsi ike ruo mgbe ebighị ebi, ruo mgbe niile ebighị ebi,+
ע [Ayin]
A na-eji eziokwu na ịkwụwa aka ọtọ edebe ya.+
פ [Pee]
צ [Sadee]
O nyewo iwu ka ọgbụgba ndụ ya dịruo mgbe ebighị ebi.+
ק [Kof]
Aha ya dị nsọ, bụrụkwa ihe a na-atụ egwu.+
ר [Resh]
10 Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite amamihe.+
ש [Sin]
Ndị niile na-edebe iwu ya nwere ezi nghọta.+
ת [Tọọ]
Otuto ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+