Fraịdee, Ọgọst 7
A malitere ịkpagbu ọgbakọ dị na Jeruselem.—Ọrụ 8:1.
Mgbe Jizọs nwụchara n’afọ 33, ọtụtụ nsogbu bịaara Ndị Kraịst bi na Jeruselem nakwa na Judia. Obere oge e hiwechara ọgbakọ Ndị Kraịst, a malitere ịkpagbu ha mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. Mgbe ihe dị ka afọ iri abụọ gachara, ezigbo ihe isi ike bịaara ndị na-eso ụzọ Jizọs. O nwere ike ịbụ na ihe kpatara ya bụ ụnwụ nri e nwere n’obodo ahụ n’oge na-adịbeghị anya. (Ọrụ 11:27-30) Ma, n’ihe dị ka afọ 61 Oge Ndị Kraịst, ihe bịara dịtụrụ Ndị Kraịst mma. Ma, mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ga-abịara ha n’ọdịnihu. N’oge ahụ, Pọl si n’ike mmụọ nsọ degara ha akwụkwọ ozi bịara nnọọ n’oge ya. Ihe mere akwụkwọ ozi ahụ Pọl degaara ndị Hibru ji bịa nnọọ n’oge ya bụ na oge udo ahụ Ndị Kraịst nwere agaghị adịte aka. Pọl kwuru ihe ndị ga-enyere ha aka idi mkpagbu ndị ga-abịara ha n’oge na-adịghị anya. w24.09 8 ¶1-2
Satọdee, Ọgọst 8
Ha na-akasikwa m nnọọ obi.—Kọl. 4:11.
Anyị tawa ahụhụ, ụmụnna anyị bụ otu ụzọ Jehova si egosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya. Ha nwere ike ịkasi anyị obi ma ha bịa nọnyere anyị, geekwa anyị ntị ka anyị na-ekwu otú obi dị anyị. Ha nwere ike ịgụrụ anyị amaokwu Baịbụl ga-akasi anyị obi ma ọ bụ kpeere anyị ekpere. (Rom 15:4) Mgbe ụfọdụ, nwanna nwere ike ichetara anyị otú Jehova si eche echiche. Ihe a nwekwara ike inyere anyị aka ịtachi obi. Ụmụnna anyị nwekwara ike isi n’ụzọ ndị ọzọ nyere anyị aka, dị ka inye anyị nri mgbe anyị nọ ná nsogbu. Mgbe ụfọdụ, anyị chọọ ka ndị ọzọ nyere anyị aka, anyị ga-agwa ha. (Ilu 17:17) E nwere ike ha amaghị otú ọ dị anyị na ihe ndị dị anyị mkpa. (Ilu 14:10) N’ihi ya, i nwere ike ịgwa ndị enyi gị ma nke a na-akọ otú ọ dị gị n’obi. Gwa ha ihe ọ ga-abụ e meere gị, ya enyere gị aka. I nwekwara ike ịgwa otu okenye ma ọ bụ ndị okenye abụọ obi ga-eru gị ala ịkọrọ nsogbu gị. Ụfọdụ ụmụnna nwaanyị achọpụtala na ịkọrọ nwanna nwaanyị ọzọ ma nke a na-akọ ihe na-echegbu ha na-akasi ha obi. w24.10 10 ¶15-16
Sọnde, Ọgọst 9
Onye ọ bụla nke nabatara Ọkpara ahụ ma nwee okwukwe na ya [ga-enwe] ndụ ebighị ebi.—Jọn 6:40.
Ọtụtụ ndị na-eri nri na-edozi ahụ́ ma na-emega ahụ́ mgbe niile ka ahụ́ gbasie ha ike. Ma, ha anaghị eme ya ka ha dịrị ndụ ebighị ebi. O nwere ike ịbụ na ha chere na ịdị ndụ ebighị ebi agaghị ekwe omume. Ma, ihe Jizọs kwuru na Jọn 3:16 na 5:24 gosiri na ụmụ mmadụ ga-adịli “ndụ ebighị ebi.” Otu ụbọchị, Jizọs rụrụ ọrụ ebube nye ọtụtụ puku mmadụ azụ̀ na achịcha. Ihe ahụ dị ịtụnanya. Mana, ihe o kwuru n’ụbọchị na-eso ya kadị dị ịtụnanya. Ìgwè mmadụ ahụ chọ ya gaa Kapaniọm nke dị nso n’akụkụ Oké Osimiri Galili. Ọ nọkwa ebe ahụ gwa ha na e nwere ike ịkpọlite ha n’ọnwụ, ha adịrị ndụ ebighị ebi. (Jọn 6:39, 40) Ihe Jizọs kwuru gosiri na a ga-akpọliteli ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ nakwa na gị na ndị ị hụrụ n’anya ga-adịli ndụ ebighị ebi. w24.12 8 ¶1-2