Mọnde, Septemba 7
Ọ na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.—Hib. 11:6.
Jehova na-eme ka obi ruo anyị ala, na-emekwa ka ihe anyị nwere ugbu a ju anyị afọ. Ọ ga-enyekwa anyị ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Anyị kwesịrị inwe olileanya n’ebe Jehova nọ, obi esie anyị ike na ọ chọrọ ịkwụ anyị ụgwọ, nweekwa ikike ọ ga-eji eme ya. Obi sie anyị ike otú a, ọ ga-eme ka anyị jiri ofufe Jehova kpọrọ ihe otú ahụ ndị ji obi ha niile fee ya n’oge gara aga mere. Ọ bụkwa ihe Timoti mere n’oge ndịozi. (Hib. 6:10-12) Timoti nwere okwukwe na Chineke dị ndụ ga-akwụ ya ụgwọ. (1 Tim. 4:10) N’ihi ya, ọ gbasiri mbọ ike n’ozi Jehova, nyekwara ndị ọzọ aka. Olee otú o si mee ya? Pọl onyeozi gbara ya ume ka ọ na-akụzikwu ihe nke ọma n’ozi ọma nakwa n’ọgbakọ. Ọ gwakwara ya ka ọ na-akpa àgwà ụmụnna ya ga-eji na-ama atụ, ma nwata ma okenye. E nyekwara ya ụfọdụ ọrụ siri ike ọ ga-arụ, ma iji obiọma nye ndụmọdụ n’ezoghị ọnụ mgbe o kwesịrị. (1 Tim. 4:11-16; 2 Tim. 4:1-5) Obi sikwara Timoti ike na Jehova ga-akwụ ya ụgwọ.—Rom 2:6, 7. w24.06 22-23 ¶10-11
Tuzdee, Septemba 8
Jehova sikwa n’aka ndị amụma ya niile . . . na-adọ ndị Izrel na ndị Juda aka ná ntị.—2 Eze 17:13.
Ọtụtụ mgbe, Jehova na-eji ndị amụma ya adọ ndị ya aka ná ntị ma na-agbazi ha. Dị ka ihe atụ, Chineke si n’aka Jeremaya gwa ndị ya, sị: “Izrel, onye na-enupụrụ m isi, lọghachi . . . Agaghị m ewesa gị iwe, n’ihi na ana m akwụsi ike n’ihe m kwuru. Agaghị m ebu iwe n’obi ruo mgbe ebighị ebi. Ma kweta na i mehiere, n’ihi na i nupụrụla Jehova bụ́ Chineke gị isi.” (Jere. 3:12, 13) Jehova sikwa n’ọnụ onye amụma bụ́ Joel gwa ndị ya, sị: “Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m.” (Joel 2:12, 13) O mere ka Aịzaya kwuo, sị: “Dowenụ onwe unu ọcha. Kwụsịnụ omume ọjọọ unu nọ n’ihu m eme. Kwụsịnụ ime ihe ọjọọ.” (Aịza. 1:16-19) O sikwa n’ọnụ Ezikiel jụọ ha, sị: “Ọ̀ na-atọ m ụtọ ka onye ajọ omume nwụọ? Ihe na-atọ m ụtọ ọ́ bụghị ka ọ hapụ ihe ọjọọ ọ na-eme wee dịrị ndụ na-aga? . . . Ọ naghị atọ m ụtọ ka onye ọ bụla nwụọ. N’ihi ya, chegharịanụ ka unu wee dịrị ndụ na-aga.” (Ezik. 18:23, 32) Obi na-atọgbu Jehova atọgbu ma ọ hụ ka ndị mmadụ chegharịrị n’ihi na ọ chọrọ ka ha dịrị ndụ ebighị ebi. w24.08 9 ¶5-6
Wenezdee, Septemba 9
Ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke. Ha bakwara uru.—2 Tim. 3:16.
Chineke na-enye ohu ya nke ọ bụla nri si n’Okwu ya, na-eduzi ya, ma na-echebe ya. Ihe ọzọ na-egosi na Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu bụ na o mere ka ndị nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa nwee ike inweta Baịbụl. Asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl bụ Hibru, Arameik, na Grik. Ndị nwere ike ịgụ asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl, ha na Jehova hà dị n’ezigbo mma karịa ndị na-enweghị ike ịgụ ha? Mbanụ. (Mat. 11:25) Ihe na-eme ka ihe anyị dị Jehova mma abụghị otú anyị gụruru akwụkwọ ma ọ bụkwanụ ma ànyị ma asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl. Jehova emeghị ka ọ bụrụ naanị ndị gụrụ oké akwụkwọ ga-enweta amamihe ya. Kama, ọ na-eme ka mmadụ niile nọ n’ụwa nweta ya, ma hà gụrụ oké akwụkwọ ma ọ bụ na ha agụghị. A sụgharịakwala Okwu ya bụ́ Baịbụl n’ọtụtụ puku asụsụ, ya emee ka ndị nọ n’ụwa niile nwee ike ịna-erite uru n’ihe ọ na-akụzi, sikwa na ya na-amụta otú ha ga-esi abụ ndị enyi ya.—2 Tim. 3:16, 17. w24.06 6-7 ¶13-15