Abụ Ọma
Ekpere Devid.
17 Jehova, biko, nụrụ ihe ziri ezi; ṅaa ntị n’ákwá m na-ebesara gị;+
Ṅaa ntị n’ekpere m ji egbugbere ọnụ nke aghụghọ na-adịghị na-ekpe.+
3 I nyochawo obi m, i nyochawo m n’abalị,+
Ị nụchawo m; ị ga-achọpụta na emeghị m atụmatụ ihe ọjọọ.+
Ọnụ m agaghị eme mmehie.+
4 A bịa n’ihe ụmụ mmadụ na-eme,
N’ihi okwu si n’egbugbere ọnụ gị, m na-ezere ụzọ onye na-apụnara mmadụ ihe.+
7 Mee ka mmeso obiọma* gị dị ebube,+ gị Onye Nzọpụta nke ndị na-achọ ebe ha ga-agbaba
Iji zere ndị na-enupụrụ aka nri gị isi.+
Zobe m na ndò nku gị,+
9 N’ihi ndị ajọ omume ndị bukọwooro ihe m.
Ndị iro bụ́ ndị na-emegide mkpụrụ obi m gbara m gburugburu na-achọ ịnwụde m.+
10 Ha ejiriwo abụba ha kpuchie onwe ha;+
Ha ejiriwo mpako kwuo okwu;+
11 Ma ha agbawo anyị gburugburu ugbu a n’ebe anyị na-azọ ụkwụ;+
Ha na-ele anyị anya iji mee ka anyị daruo ala.+
13 Biko, Jehova, bilie; zute ya ihu na ihu;+
Mee ka o huru ehuru; jiri mma agha gị meere mkpụrụ obi m ụzọ ọ ga-esi gbapụ n’aka onye ajọ omume,+
14 Jehova, jiri ogwe aka gị mee ka m gbapụ n’aka ndị mmadụ,+
N’aka ndị mmadụ nọ n’usoro ihe a,+ bụ́ ndị òkè ha dị ná ndụ a,+
Ndị i jikwa akụ̀ gị zoro ezo mee ka afọ ju,+
Ndị mụrụ ụmụ otú zuuru ha,+
Ndị na-ahapụrụ ụmụ ha akụ̀ ha kpatara.+