91 Onye ọ bụla nke bi n’ebe nzuzo+ nke Onye Kasị Elu+
Ga-enwetara onwe ya ebe obibi na ndò nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+
2 M ga-asị Jehova: “Ị bụ ebe mgbaba m na ebe m e wusiri ike,+
Chineke m, onye m ga-atụkwasị obi.”+
3 N’ihi na ọ ga-anapụta gị n’ọnyà nke onye na-achụ nta nnụnụ siri,+
Napụtakwa gị n’ọrịa na-efe efe nke na-akpata nhụjuanya.+
4 Ọ ga-eji nku ya chebe gị,+
Ị ga-agbabakwa n’okpuru nku ya.+
Eziokwu ya+ ga-abụrụ gị ọta ukwu+ na mgbidi siri ike.
5 Ị gaghị atụ egwu ihe ọ bụla na-emenye ụjọ n’abalị,+
Ma ọ bụ akụ́+ nke na-efe n’ehihie,
6 Ma ọ bụ ọrịa na-efe efe nke na-agagharị n’ọchịchịrị,+
Ma ọ bụ ihe na-ebibi ihe n’etiti ehihie.+
7 Otu puku mmadụ ga-ada n’akụkụ gị,
Puku iri adaakwa n’aka nri gị;
Ma ọ gaghị abịaru gị nso.+
8 Ị ga na-ele naanị n’anya+
Wee hụ ụgwọ a na-akwụ ndị ajọ omume.+
9 N’ihi na ị sịrị: “Jehova bụ ebe mgbaba m,”+
I mewo ka Onye Kasị Elu bụrụ ebe obibi gị;+
10 Ọ dịghị ọdachi ga-adakwasị gị,+
Ọbụna ihe otiti agaghị eru ụlọikwuu gị nso.+
11 N’ihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị,+
Ka ha chee gị nche n’ụzọ gị niile.+
12 Ha ga-eji aka ha ghọrọ gị,+
Ka ị ghara ịkpọ ụkwụ na nkume ọ bụla.+
13 Ị ga-azọ nwa ọdụm na agwọ ubí ụkwụ;+
Ị ga-azọkwasị nwa ọdụm tojuru etoju na nnukwu agwọ ụkwụ.+
14 N’ihi na ọ hụrụ m n’anya nke ukwuu,+
M ga-emekwara ya ụzọ mgbapụ.+
M ga-echebe ya n’ihi na ọ matawo aha m.+
15 Ọ ga-akpọku m, m ga-azakwa ya.+
M ga-anọnyere ya n’oge ahụhụ.+
M ga-anapụta ya ma bulie ya elu.+
16 M ga-eji ogologo ndụ mee ka afọ ju ya,+
M ga-emekwa ka ọ hụ nzọpụta m.+