Abụ olu ụtọ.
98 Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ,+
N’ihi na ihe ndị o mere dị ebube.+
Aka nri ya, ya bụ, ogwe aka ya nke dị nsọ, enwetaworo ya nzọpụta.+
2 Jehova emewo ka a mara nzọpụta ya;+
O kpughewo ezi omume ya n’anya mba dị iche iche.+
3 O chetawo obiọma ya na ikwesị ntụkwasị obi ya n’ebe ụlọ Izrel nọ.+
Nsọtụ niile nke ụwa ahụwo nzọpụta si n’aka Chineke anyị.+
4 Tikuonụ Jehova mkpu mmeri, unu ndị niile bi n’ụwa.+
Nweenụ obi ụtọ, tienụ mkpu ọṅụ, bụọkwanụ abụ olu ụtọ.+
5 Jirinụ ụbọ akwara bụkuo Jehova abụ olu ụtọ,+
Jirinụ ụbọ akwara na abụ olu ụtọ bụkuo ya abụ.+
6 Jirinụ opi na ụda opi+
Tie mkpu mmeri n’ihu Eze, bụ́ Jehova.
7 Ka oké osimiri bigbọọ, ya na ihe jupụtara n’ime ya,+
Ma elu ala ma ndị bi n’ime ya.+
8 Ka osimiri kụọ aka;
Ka ugwu niile tie mkpu ọṅụ+
9 N’ihu Jehova, n’ihi na ọ bịawo ikpe ụwa ikpe.+
Ọ ga-ekpe elu ala ikpe n’ezi omume,+
Kpeekwa ndị dị iche iche ikpe ziri ezi.+