Levitikọs
1 Jehova wee si n’ụlọikwuu nzute kpọọ Mozis òkù,+ sị ya: 2 “Gwa ụmụ Izrel okwu,+ sị ha, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu chọrọ iji anụ ụlọ chụọrọ Jehova àjà, unu ga-eji anụ si n’ìgwè ehi nakwa n’ìgwè ewu na atụrụ chụọ àjà unu.
3 “‘Ọ bụrụ na àjà ya bụ àjà nsure ọkụ+ nke a ga-eji anụ si n’ìgwè ehi chụọ, ọ ga-eweta oké, nke ahụ́ dị mma.+ N’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ka ọ ga-eji obi ya chee ya n’ihu Jehova.+ 4 Ọ ga-ebikwasịkwa aka n’isi anụ àjà nsure ọkụ ahụ, a ga-anabatakwa ya nke ọma+ iji kpuchiere ya mmehie ya.+
5 “‘Mgbe ahụ, a ga-egbu nwa oké ehi ahụ n’ihu Jehova; ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà,+ ga-ewetakwa ọbara ya ma fesa ọbara ahụ gburugburu n’elu ebe ịchụàjà+ nke dị n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 6 A ga-agba anụ àjà nsure ọkụ ahụ akpụkpọ, bọọ ya.+ 7 Ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà, ga-etinyekwa ọkụ n’elu ebe ịchụàjà+ ma sonye nkụ n’ọkụ ahụ.+ 8 Ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà, ga-edo anụ ahụ+ a bọrọ abọ n’usoro, dookwa isi ya na abụba ya n’elu nkụ ahụ e sonyere n’ọkụ ahụ dị n’elu ebe ịchụàjà. 9 A ga-eji mmiri saa eriri afọ ya+ na ụkwụ ya; onye nchụàjà ga-esurekwa ha niile n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà dị ka àjà nsure ọkụ, bụ́ àjà na-esi ísì ụtọ nke a na-esurere Jehova n’ọkụ.+
10 “‘Ọ bụrụ na anụ ọ ga-eweta maka àjà nsure ọkụ ga-esi n’ìgwè ewu na atụrụ,+ n’ụmụ ebule ma ọ bụ ewu, ọ ga-eweta oké,+ nke ahụ́ dị mma.+ 11 A ga-egbukwa ya n’ihu Jehova n’akụkụ ebe ugwu nke ebe ịchụàjà, ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà, ga-efesa ọbara ya gburugburu n’elu ebe ịchụàjà.+ 12 Ọ ga-abọkwa ya, bọpụta ma isi ya ma abụba ya, onye nchụàjà ga-edokwa ha n’usoro n’elu nkụ ahụ e sonyere n’ọkụ ahụ dị n’elu ebe ịchụàjà.+ 13 Ọ ga-ejikwa mmiri saa eriri afọ+ ya na ụkwụ ya;+ onye nchụàjà ga-eweta ha niile suree ha n’ọkụ+ n’elu ebe ịchụàjà. Ọ bụ àjà nsure ọkụ, àjà na-esi ísì ụtọ nke a na-esurere Jehova n’ọkụ.+
14 “‘Otú ọ dị, ọ bụrụ na anụ ọ ga-eweta ka e were ya chụọrọ Jehova àjà nsure ọkụ ga-esi n’anụ ufe, ọ ga-esi ná nduru+ ma ọ bụ n’ụmụ kpalakwukwu+ weta ya. 15 Onye nchụàjà ga-ewetakwa ya n’ebe ịchụàjà, tụbie+ ya olu ma suree ya n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà, ma ọ ga-ahapụ ka ọbara ya gbasịsịa n’akụkụ ebe ịchụàjà. 16 Ọ ga-ewepụkwa akpa nri ya, tụchasịa ábụ́bà ya ma wụsa ha n’akụkụ ebe ịchụàjà, n’ebe ọwụwa anyanwụ, n’ebe a na-awụsa ntụ nke ya na abụba gwakọtara.+ 17 Ọ ga-esi n’etiti nku ya abụọ nyawaa ya. Ọ gaghị anyakapụ ya anyakapụ.+ Mgbe ahụ, onye nchụàjà ga-esure ya n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà, n’elu nkụ dị n’ọkụ. Ọ bụ àjà nsure ọkụ,+ àjà na-esi ísì ụtọ nke a na-esurere Jehova n’ọkụ.+