Jona
3 Okwu Jehova wee ruo Jona ntị nke ugboro abụọ, sị:+ 2 “Bilie, gaa Ninive bụ́ obodo ukwu, kwusaara+ ya okwu m na-agwa gị.”
3 Jona wee bilie gaa Ninive dị ka Jehova+ kwuru. Ninive bụ obodo dị nnọọ ukwuu n’anya Chineke,+ nke ga-ewe onye ji ụkwụ ụbọchị atọ iji gazuo ya. 4 E mesịa, Jona banyere n’obodo ahụ, garuo ebe were ya otu ụbọchị, o wee na-ekwusa, sị: “Naanị ụbọchị iri anọ fọrọ ka a kwatuo Ninive.”+
5 Ndị Ninive wee malite inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ,+ ha wee kpọsaa ibu ọnụ nakwa ka e yiri ákwà iru uju,+ malite n’onye kasị ukwuu n’ime ha ọbụna ruo n’onye kasị nta n’ime ha. 6 Mgbe okwu ahụ ruru eze Ninive ntị,+ o biliri n’ocheeze ya wee yipụ uwe eze ya ma yiri ákwà iru uju wee nọdụ ala ná ntụ.+ 7 O mekwara ka a kpọsaa ya, meekwa ka e kwusaa ya na Ninive, ka ọ bụrụ iwu nke eze na ndị ukwu ya tiri, sị:
“Ọ dịghị mmadụ na anụ ụlọ ọ bụla, ọ dịghịkwa ìgwè ehi na ìgwè atụrụ ọ bụla nke ga-edetụ ihe ọ bụla ọnụ. Ọ dịghị nke ga-eri ihe oriri. Ha agaghị aṅụ ọbụna mmiri.+ 8 Ka ha yiri ákwà iru uju, ma mmadụ ma anụ ụlọ; ka ha kpọkusie Chineke ike, ka onye ọ bụla hapụkwa+ ụzọ ọjọọ ya na ihe ike ọ na-eme. 9 Ònye manụ ma ezi Chineke ọ̀ ga-alaghachi azụ ma gbanwee obi+ ya wee mee ka iwe ya dị ọkụ dajụọ, anyị ewee ghara ịla n’iyi?”+
10 Ezi Chineke wee hụ ọrụ ha,+ na ha ahapụwo ụzọ ọjọọ ha;+ ezi Chineke wee gbanwee obi+ ya banyere ọdachi+ o kwuru na ya ga-ewetara ha; o wetaghịzi ya.