Zefanaya
2 Zukọtanụ, ee, zukọtanụ,+ gị mba na-enweghị ihere.+ 2 Tupu ụkpụrụ emezuo,+ tupu ụbọchị unu agabiga dị ka igbogbo ọka, tupu ọnụma Jehova abịakwasị unu,+ tupu ụbọchị iwe Jehova abịakwasị unu,+ 3 chọọnụ Jehova,+ unu niile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa,+ ndị meworo ihe o kpere n’ikpe. Chọọnụ ezi omume,+ chọọnụ ịdị umeala n’obi.+ Ma eleghị anya,+ a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.+ 4 N’ihi na Geza ga-aghọ obodo a gbahapụrụ agbahapụ;+ Ashkelọn ga-abụ ebe tọgbọrọ n’efu.+ Ma a ga-achụpụ Ashdọd+ n’etiti ehihie;+ a ga-efopụkwa Ekrọn.+
5 “Ahụhụ ga-adịrị ndị bi n’ógbè oké osimiri, bụ́ mba ndị Keretaịt!+ Okwu Jehova na-emegide unu. Gị Kenan, bụ́ ala ndị Filistia, m ga-ebibikwa gị, ka a ghara inwe onye ga-ebi n’ime gị.+ 6 Ógbè oké osimiri ga-aghọ ala ịta ahịhịa,+ nke nwere olulu mmiri maka ndị na-azụ atụrụ nakwa ogige atụrụ ndị e ji nkume gbaa. 7 Ọ ga-aghọkwa ógbè nke ndị fọdụrụ n’ụlọ Juda.+ Ha ga-atakwa nri na ya. Ha ga-edina n’ụlọ ndị dị n’Ashkelọn ná mgbede wee tụsara ahụ́. N’ihi na Jehova Chineke ha ga-eche ihu ya n’ebe ha nọ+ wee chịkọtaghachi ndị a dọọrọ n’agha n’ime ha.”+
8 “Anụwo m nkọcha Moab+ na-akọcha ndị m, nụkwa mkparị ụmụ Amọn+ na-akparị ha, ha na-ebulikwa onwe ha elu megide ókèala ha. 9 Ya mere, dị nnọọ ka m dị ndụ,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, “Moab ga-adị nnọọ ka Sọdọm,+ ụmụ Amọn+ ga-adịkwa ka Gọmọra, bụ́ ebe ahịhịa akụwa jupụtara, ọ ga-adịkwa ka olulu nnu, bụrụkwa ebe tọgbọ n’efu, ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.+ Ndị fọdụrụ ná ndị m ga-akwakọrọ ihe dị na ha, ihe fọdụrụ n’ime mba nke m ga-ebichi ha.+ 10 Nke a ka ha ga-enweta n’ihi mpako ha,+ n’ihi na ha kọchara ndị Jehova nke ụsụụ ndị agha ma na-ebuli onwe ha elu megide ha.+ 11 Jehova ga-emenye ha egwu;+ n’ihi na ọ ga-eme ka chi niile taa ahụ́,+ ndị mmadụ ga-akpọkwara ya isiala,+ onye nke ọ bụla site n’ebe nke ya, bụ́ agwaetiti niile nke mba dị iche iche.+
12 “Unu onwe unu kwa, ndị Itiopia,+ mma agha m ga-egbu unu.+
13 “Ọ ga-esetị aka ya n’ebe ugwu, ọ ga-ebibikwa Asiria.+ Ọ ga-emekwa ka Ninive bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu,+ meekwa ka ógbè nke mmiri na-adịghị dị ka ala ịkpa. 14 Ọ bụkwa na ya ka ìgwè anụmanụ ga-amakpu, bụ́ anụ ọhịa niile dị ná mba dị iche iche.+ Ma okwolo ma ebi ogwu+ ga-anọbọ chi n’isi ogidi+ ya. A ga na-anụ ubé nnụnụ* na windo ya. A gaje ịla ihe n’iyi n’ụzọ mbata ya; n’ihi na ọ ga-ewepụsị osisi e ji kụchie ya.+ 15 Nke a bụ obodo ahụ na-enwe aṅụrị, nke nọkwa n’obi iru ala,+ nke nọ na-asị n’obi ya, ‘Anọ m ya, ọ dịghị onye ọzọ nọnụ.’+ Lee ka o si ghọọ ihe ijuanya, ebe anụ ọhịa na-amakpu! Onye ọ bụla nke na-agafere ya ga-afụ mkpọrọhịhị; ọ ga-agbakwa n’aka.”+