Malakaị
4 “N’ihi na, lee! ụbọchị nke na-ere dị ka oké ọkụ na-abịa,+ ndị niile dị mpako na ndị niile na-eme ajọ omume ga-adị ka ahịhịa ọka.+ Ụbọchị ahụ nke na-abịa ga-erepịakwa ha,” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “nke na ọ gaghị erefọ mgbọrọgwụ ha ma ọ bụ alaka ha.+ 2 Ma anyanwụ nke ezi omume, bụ́ nke nku ya na-eweta ọgwụgwọ,+ ga-awakwasị unu+ ndị na-atụ egwu aha m; unu ga-apụkwa na-awụgharị dị ka ehi mara abụba.”+
3 “Unu ga-azọda ndị ajọ omume, n’ihi na ha ga-adị ka ntụ n’okpuru ọbụ ụkwụ unu n’ụbọchị m ga-eme ihe,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.
4 “Chetanụ iwu m nyere Mozis ohu m n’ugwu Horeb banyere Izrel dum, ya bụ, ụkpụrụ na mkpebi ikpe dị iche iche.+
5 “Lee! M na-ezitere unu Ịlaịja onye amụma+ tupu oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova abịa.+ 6 Ọ ga-eme ka obi ndị bụ́ nna chigharịkwuru ụmụ ha, meekwa ka obi ụmụ chigharịkwuru nna ha; ka m ghara ịbịa tie ụwa ihe otiti wee bibie ya.”+
(Ebe a ka nsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru na Arameik gwụrụ.
Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ga-esochi ya.)