Faịlimọn
1 Mụ onwe m bụ́ Pọl, onye mkpọrọ+ n’ihi Kraịst Jizọs, na Timoti,+ bụ́ nwanna anyị, na-edetara Faịlimọn, bụ́ onye anyị hụrụ n’anya na onye ọrụ ibe anyị+ 2 na Afia, bụ́ nwanna anyị nwaanyị na Akịpọs,+ bụ́ onye agha ibe anyị,+ nakwa ọgbakọ nke dị n’ụlọ gị,+ akwụkwọ:
3 Ka obiọma na-erughịrị mmadụ na udo nke si n’aka Chineke, bụ́ Nna anyị, nakwa n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dịrị unu.+
4 Ana m ekele Chineke m mgbe niile m na-echeta gị n’ekpere m,+ 5 ebe ọ bụ na m na-anụ banyere ịhụnanya na okwukwe i nwere n’ebe Onyenwe anyị Jizọs nọ nakwa n’ebe ndị nsọ niile nọ;+ 6 ka okwukwe+ gị nke ị na-eme ka ndị ọzọ soro gị nwee wee nwee ike ịdị irè site na gị onwe gị ịnabata ezi ihe ọ bụla dị n’etiti anyị dị ka nke metụtara Kraịst. 7 N’ihi na enwetara m ọṅụ na nkasi obi dị ukwuu n’ịhụnanya gị,+ n’ihi na gị onwe gị, nwanna m, e mewo ka obi ọmịiko nke ndị nsọ dị ọhụrụ.+
8 N’ihi ya, ọ bụ ezie na m nwere nkwuwa okwu dị ukwuu n’ime Kraịst, inye gị iwu+ ime ihe kwesịrị ekwesị, 9 kama ime otú ahụ, eji m ịhụnanya na-agba gị ume,+ ebe ị hụrụ ụdị mmadụ m bụ, mụ bụ́ Pọl, nwoke meworo agadi, onye bụkwa onye mkpọrọ+ ugbu a n’ihi Kraịst Jizọs; 10 ana m agba gị ume banyere nwa m,+ bụ́ Onesịmọs,+ onye m ghọrọ nna ya+ mgbe m nọ n’agbụ ụlọ mkpọrọ, 11 bụ́ onye na-abaghịrị gị uru n’oge gara aga ma ọ baara mụ na gị uru ugbu a.+ 12 Ọ bụ onye a ka m na-ezighachitere gị, ee, ọ bụ ya, ya bụ, onye m nwere obi ọmịiko n’ebe ọ nọ.+
13 M gaara achọ ime ka mụ na ya nọrọ ka o wee na-ejere m ozi ị gaara ejere m+ n’agbụ e kere m n’ụlọ mkpọrọ+ n’ihi ozi ọma. 14 Ma achọghị m ime ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na ị kwadoghị ya, ka omume ọma gị wee si gị n’obi,+ ọ bụghị ná mmanye. 15 Ikekwe, ọ bụ ya n’ezie mere o ji gbapụ ruo otu awa, ka i wee kpọrọghachi ya ruo mgbe ebighị ebi, 16 ọ bụkwaghị dị ka ohu+ kama dị ka onye karịrị ohu,+ dị ka nwanna a hụrụ n’anya,+ karịsịa n’ebe m nọ, ma ya fọdụzie n’ebe ị nọ, ma n’anụ ahụ́ ma n’ime Onyenwe anyị. 17 Ya mere, ọ bụrụ na ị gụrụ m n’onye nketa,+ jiri obiọma nabata+ ya otú ị ga-esi nabata m. 18 Ọ bụrụkwa na o mere gị ihe ọjọọ ọ bụla ma ọ bụ jiri gị ụgwọ ọ bụla, gụọrọ m ya n’ihe m ga-akwụ. 19 Mụ onwe m bụ́ Pọl, ọ bụ m ji aka m na-ede ya:+ aga m akwụ gị ya, ọ baghị uru ịgwawa gị ya, e kwuwerị, i ji m ọbụna onwe gị n’ụgwọ. 20 Ee, nwanna m, ka m rite uru n’aka gị n’ihi Onyenwe anyị: mee ka obi ọmịiko+ m nwere n’ime Kraịst dị ọhụrụ.
21 Ebe m nwere ntụkwasị obi na ị ga-ekwere, ana m edetara gị akwụkwọ, ebe m maara na ị ga-eme ọbụna karịa ihe m na-ekwu.+ 22 Ma tụkwasị na nke ahụ, doziere m ebe m ga-ebi,+ n’ihi na enwere m olileanya na site n’ekpere unu,+ a ga-eme ka m nwere onwe m+ n’ihi unu.
23 Epafras,+ bụ́ onye mkpọrọ ibe m n’ihi Kraịst Jizọs, na-ekele gị, 24 tinyere Mak, Arịstakọs,+ Dimas,+ Luk, bụ́ ndị ọrụ ibe m.
25 Ka obiọma Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-erughịrị mmadụ dịnyere mmụọ unu na-egosi.+