1 Samuel
19 E mesịa, Sọl gwara Jọnatan nwa ya na ndị niile na-ejere ya ozi okwu banyere igbu Devid.+ 2 Ma ihe Devid dị Jọnatan nwa Sọl mma nke ukwuu.+ Ya mere, Jọnatan gwara Devid, sị: “Sọl nna m na-achọ igbu gị. Biko, kpachara anya n’ụtụtụ, nọrọ n’ebe zoro ezo, zookwa ezo.+ 3 Ma mụ onwe m ga-apụ guzoro n’akụkụ nna m n’ọhịa ebe ị ga-anọ, m ga-agwakwa nna m okwu banyere gị, m ga-ahụ ihe ga-emenụ, aghaghịkwa m ịkọrọ gị ya.”+
4 Jọnatan wee gwa Sọl nna ya okwu ọma+ banyere Devid, sị ya: “Ka eze ghara imehie+ ohu ya Devid, n’ihi na o mehieghị gị, ọrụ ọ na-arụrụ gị dịkwa nnọọ mma.+ 5 O tinyere mkpụrụ obi ya n’ihe ize ndụ+ wee gbuo onye Filistia ahụ,+ Jehova wee zọpụta+ Izrel dum n’ụzọ dị ukwuu. Ị hụrụ ya, ị ṅụrịkwara ọṅụ. Gịnị mere ị ga-eji mehie megide ọbara na-emeghị ihe ọjọọ site n’igbu+ Devid n’enweghị ihe o mere?”+ 6 Sọl wee rube isi n’ihe Jọnatan kwuru, Sọl wee ṅụọ iyi, sị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ,+ a gaghị egbu ya.” 7 E mesịa, Jọnatan kpọrọ Devid, Jọnatan wee kọọrọ ya ihe a niile. Jọnatan wee kpọrọ Devid kpọtara Sọl, o wee na-anọ n’ihu ya dị ka ọ na-anọ n’oge mbụ.+
8 Ka oge na-aga, agha dara ọzọ, Devid wee gaa lụso ndị Filistia agha, sụọ ha akwụ,+ ha wee si n’ihu ya gbaa ọsọ.+
9 Mmụọ na-adịghị mma+ nke si n’ebe Jehova nọ wee dakwasị Sọl mgbe ọ nọ ọdụ n’ụlọ ya, jirikwa ube ya n’aka, ka Devid nọ na-akpọ ụbọ. 10 Sọl wee chọọ iji ube ahụ tụgide Devid n’ahụ́ ájá,+ ma o zere+ pụọ n’ihu Sọl, nke mere na ọ tụrụ ube ahụ n’ahụ́ ájá. Devid wee gbapụ ka ọ gbalaga n’abalị ahụ.+ 11 E mesịa, Sọl zipụrụ ndị ozi+ ka ha chee ụlọ Devid nche, ka ha gbuokwa ya n’ụtụtụ;+ ma Maịkal nwunye Devid gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na i kweghị ka mkpụrụ obi gị gbapụ n’abalị a, echi ị ga-abụ onye e gburu egbu.” 12 Ozugbo ahụ, Maịkal mere ka Devid si na windo rịda, ka o wee pụọ gbapụ ma gbalaga.+ 13 Maịkal wee were ihe oyiyi terafim+ debe n’ihe ndina ya, tinye ákwà na-ahụ ụzọ nke e ji ajị ewu kpaa n’ebe isi ya na-adị, werezie ákwà kpuchie ya.
14 Sọl wee zipụ ndị ozi ka ha kpọta Devid, ma Maịkal sịrị ha: “Ahụ́ adịghị ya.”+ 15 Sọl wee zipụ ndị ozi ahụ ka ha gaa hụ Devid, sị: “Burunụ ya n’ihe ndina ya butere m ka m gbuo ya.”+ 16 Mgbe ndị ozi ahụ batara, lee, ọ bụ ihe oyiyi terafim tọgbọ n’elu ihe ndina, ákwà na-ahụ ụzọ nke e ji ajị ewu kpaa dịkwa n’ebe isi ya na-adị. 17 Sọl wee sị Maịkal: “Gịnị mere i ji ghọọ m ụdị aghụghọ+ a wee hapụ onye iro m+ ka ọ gbaa ọsọ?” Maịkal wee sị Sọl: “Ọ bụ ya sịrị m, ‘Hapụ m ka m gbapụ! Ị̀ chọrọ ka m gbuo gị?’”
18 Ma Devid gbapụrụ wee gbalaga,+ gbakwuru Samuel n’ime Rema.+ O wee gwa ya ihe niile Sọl mere ya. Ya na Samuel wee pụọ, ha wee gaa biri na Nayọt.+ 19 Ka oge na-aga, akụkọ ruru Sọl ntị, sị: “Lee! Devid nọ na Nayọt nke dị na Rema.” 20 Ozugbo ahụ, Sọl zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kpọta Devid. Mgbe ha hụrụ ndị mere okenye n’ime ndị amụma ka ha na-ebu amụma, hụkwa ka Samuel guzo dị ka onyeisi ha, mmụọ+ Chineke dakwasịrị ndị ozi Sọl, ha wee malite ime dị ka ndị amụma,+ ha onwe ha kwa.
21 Mgbe ha kọọrọ ya Sọl, o zipụrụ ndị ozi ọzọ ozugbo, ha malitekwara ime dị ka ndị amụma, ha onwe ha kwa. Ya mere, Sọl zipụrụ ndị ozi ọzọ, ìgwè nke atọ, ha malitekwara ime dị ka ndị amụma, ha onwe ha kwa. 22 N’ikpeazụ, ya onwe ya gara Rema. Mgbe o ruru ná nnukwu olulu mmiri nke dị na Siku, ọ malitere ịjụ ajụjụ, sị: “Ebee ka Samuel na Devid nọ?” Ha wee sị: “Ọ bụ na Nayọt+ nke dị na Rema.” 23 O wee si n’ebe ahụ gagide ruo Nayọt nke dị na Rema, mmụọ+ Chineke wee dakwasị ya, ee, ya onwe ya, o wee na-eje ije ma na-eme dị ka onye amụma ruo mgbe ọ batara Nayọt nke dị na Rema. 24 Ya onwe ya kwa yipụrụ uwe ya ma na-eme dị ka onye amụma n’ihu Samuel, ee, ya onwe ya, ọ gbakwa ọtọ dinara ala n’ehihie ahụ dum nakwa n’abalị ahụ dum.+ Ọ bụ ya mere ha ji asị: “Sọl ò sokwu ná ndị amụma?”+