1 Samuel
27 Otú ọ dị, Devid kwuru n’obi ya, sị: “Otu ụbọchị aka Sọl ga-ala m n’iyi. Ọ dịghị ihe kara m mma ma ọ bụghị ịgbaga+ n’ala ndị Filistia;+ ike ga-agwụkwa Sọl ịchọ m n’ókèala dum nke Izrel,+ m ga-agbapụkwa n’aka ya.” 2 Devid wee bilie, ya na narị ndị ikom isii+ so ya wee gakwuru Ekish+ nwa Meyọk, eze Gat. 3 Devid wee binyere Ekish n’ime Gat, ya na ndị ikom ya, onye nke ọ bụla na ezinụlọ ya,+ Devid na nwunye ya abụọ, bụ́ Ahịnoam+ nwaanyị Jezril na Abigel,+ nwunye Nebal, nwaanyị Kamel. 4 Ka oge na-aga, a kọọrọ Sọl na Devid agbagawo Gat, ọ gakwaghị ọzọ ịchọ ya.+
5 Devid wee sị Ekish: “Ọ bụrụ na ihe m dị gị mma, ka ha nye m otu ebe n’otu n’ime obodo dị n’ime ime, ka m biri n’ebe ahụ; n’ihi na olee otú ohu gị ga-esi binyere gị n’obodo eze?” 6 Ekish wee nye ya Ziklag+ n’ụbọchị ahụ. Ọ bụ ya mere o ji bụrụ ndị eze Juda nwe Ziklag ruo taa.
7 Ụbọchị niile Devid biri n’ime ime obodo ndị Filistia dị otu afọ na ọnwa anọ.+ 8 Devid na ndị ikom ya wee gbagoo ka ha wakpo ndị Geshọ+ na ndị Gazaịt na ndị Amalek;+ n’ihi na ọ bụ ha bi n’ala si Tilam+ ruo Shọọ,+ ruokwa n’ala Ijipt. 9 Devid wee wakpo ala ahụ, ma ọ hapụghị ma nwoke ma nwaanyị ndụ;+ ọ chịkwaara ìgwè ewu na atụrụ na ìgwè ehi na ịnyịnya ibu na kamel na uwe, e mesịa, ọ laghachiri wee bịakwute Ekish. 10 Ekish wee sị: “Olee ebe unu wakporo taa?” Devid wee sị:+ “Na ndịda Juda+ nakwa n’ebe ndịda nke ndị Jeramiel+ nakwa n’ebe ndịda nke ndị Kenaịt.”+ 11 Ma ọ dịghị onye Devid hapụrụ ndụ, ma nwoke ma nwaanyị, ka ọ kpọrọ ha lọta na Gat, n’ihi na ọ sịrị: “Ka ha ghara ịgbabọ anyị, sị, ‘Ọ bụ otú a ka Devid mere.’”+ (Ọ bụkwa otú a ka ọ na-eme n’ụbọchị niile o biri n’ime ime obodo ndị Filistia.) 12 N’ihi ya, Ekish kwetara ihe Devid kwuru,+ wee sị n’obi ya: “N’ezie, ọ ghọwo ihe na-esi ísì n’etiti ndị ya Izrel;+ ọ ga-abụkwa onye na-ejere m ozi ruo mgbe a na-akaghị aka.”