1 Samuel
8 O wee ruo na ozugbo Samuel mere agadi, ọ họpụtara+ ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ ndị ikpe Izrel. 2 Aha ọkpara ya bụ Joel,+ aha nwa ya nwoke nke abụọ bụ Abaịja;+ ha nọ na Bia-shiba na-ekpe ikpe. 3 Ụmụ ya ejeghị ije n’ụzọ o jere,+ kama ha na-achọ uru na-ezighị ezi,+ na-erikwa ngarị+ ma na-agbagọ ikpe.+
4 Ka oge na-aga, ndị okenye niile nke Izrel+ zukọtara wee bịakwute Samuel na Rema, 5 sị ya: “Lee! Gị onwe gị emewo agadi, ma ụmụ gị adịghị eje ije n’ụzọ i jere. Họpụtara anyị eze+ ga na-ekpe anyị ikpe dị ka mba niile ọzọ.” 6 Ma ihe ahụ dị njọ n’anya Samuel na ha sịrị: “Nye anyị eze ga na-ekpe anyị ikpe.” Samuel wee malite ikpeku Jehova ekpere.+ 7 Jehova wee sị Samuel:+ “Gee ntị n’olu ha n’ihe niile ha na-agwa gị;+ n’ihi na ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ m ka ha jụrụ ịbụ eze+ ha. 8 Dị ka ihe niile ha mere si dị, malite n’ụbọchị m si n’Ijipt kpọpụta ha+ ruo taa, na-ahapụ m+ ma na-efe chi ọzọ dị iche iche,+ ọ bụ otú ahụ ka ha na-emekwa gị. 9 Ma ugbu a, gee ntị n’olu ha. Ọ bụ naanị na ị ga-adọsi ha aka ná ntị ike, gwakwa ha ihe ruuru eze ga-achị ha.”+
10 Samuel wee gwa ndị ahụ na-achọ ka o nye ha eze ihe niile Jehova kwuru. 11 O wee sị: “Nke a ga-abụ ihe ruuru+ eze ga na-achị unu: Ọ ga-akpọrọ ụmụ unu ndị ikom+ wee mee ka ha bụrụ ndị na-anọkwasịrị ya n’ụgbọ ịnyịnya,+ meekwa ka ha soro ná ndị na-agba ịnyịnya ya,+ ụfọdụ ga na-agbakwa ọsọ n’ihu ụgbọ ịnyịnya ya;+ 12 ọ ga-ahọpụtakwara onwe ya ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha+ na ndị isi nke ndị agha iri ise iri ise,+ họpụtakwa ụfọdụ ka ha na-akọrọ ya ubi,+ na-ewekwara ya ihe ubi,+ na-akpụkwara ya ngwá agha+ na ngwá ụgbọ ịnyịnya.+ 13 Ọ ga-akpọrọ ụmụ unu ndị inyom ka ha bụrụ ndị na-esi mmanụ na ndị na-esi nri na ndị na-eme achịcha.+ 14 Ala unu na ubi vaịn unu+ na ubi oliv unu,+ ndị kasị mma, ka ọ ga-ewere nye ndị na-ejere ya ozi. 15 Ọ ga-ewerekwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpụrụ si n’ubi unu na nke ubi vaịn unu,+ ọ ga-ewerekwa ha nye ndị na-eje ozi n’obí ya+ nakwa ndị na-ejere ya ozi. 16 Ndị ikom na-ejere unu ozi na ndị inyom na-ejere unu ozi ka ọ ga-akpọrọ, werekwa ìgwè ehi unu kasị mma na ịnyịnya ibu unu, meekwa ka ha na-arụrụ ya ọrụ.+ 17 Ọ ga-ewere otu ụzọ n’ụzọ iri nke ìgwè ewu na atụrụ unu,+ unu onwe unu ga-abụkwa ndị na-ejere ya ozi. 18 Unu ga-eti mkpu ákwá n’ụbọchị ahụ n’ihi eze unu,+ bụ́ onye unu onwe unu họọrọ, ma Jehova agaghị aza unu n’ụbọchị ahụ.”+
19 Otú ọ dị, ụmụ Izrel jụrụ ige ntị n’olu Samuel+ wee sị: “Ee e, kama ọ bụ eze ga-achị anyị. 20 Anyị onwe anyị ga-adịkwa ka mba niile ọzọ,+ eze anyị ga na-ekpekwa anyị ikpe, na-agakwa n’ihu anyị ma na-eburu anyị agha.” 21 Samuel wee gee ntị n’okwu niile ụmụ Izrel kwuru; o wee gwa ya Jehova.+ 22 Jehova wee sị Samuel: “Gee ntị n’olu ha, meekwa ka eze chịwa ha.”+ Samuel wee sị ụmụ Izrel: “Onye ọ bụla laa n’obodo ya.”