13 Ọ ga-awụsakwa ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ n’elu ọkụ ahụ n’ihu Jehova,+ anwụrụ ọkụ nke ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ ga-ekpuchi ihe mkpuchi Igbe ahụ,+ bụ́ nke dị n’elu Ihe Àmà ahụ,+ ka ọ ghara ịnwụ.
40 ka ha bụụrụ ụmụ Izrel ihe ncheta, na onye ọzọ+ na-abụghị nwa Erọn agaghị abịa nso isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Jehova,+ ọ dịghịkwa onye ga-adị ka Kora na ndị ya na ha zukọtara,+ dị nnọọ ka Jehova gwara ya site n’ọnụ Mozis.
28 E wee si n’ebo Izrel dum họpụtara m ya,+ ịrụ ọrụ dị ka onye nchụàjà nakwa ịgbago n’elu ebe ịchụàjà m+ isure ihe nsure ọkụ, iyi efọd n’ihu m, ka m wee nye ụlọ nna nna gị àjà niile ụmụ Izrel na-esure n’ọkụ.+
13 Ụmụ Amram bụ Erọn+ na Mozis.+ Ma e doro Erọn iche+ ka o wee na-edo Ebe Kasị Nsọ nsọ,+ ya na ụmụ ya ndị ikom, ruo mgbe a na-akaghị aka, isure ihe nsure+ ọkụ n’ihu Jehova, ijere ya ozi+ na iji aha ya na-agọzi+ ndị mmadụ ruo mgbe a na-akaghị aka.