2 Cheta ụzọ niile Jehova bụ́ Chineke gị mere ka i jegharịa n’ala ịkpa n’ime afọ iri anọ ndị a,+ iji mee ka ị dị umeala,+ iji lee gị ule+ ka ọ mara ihe dị gị n’obi,+ iji mara ma ị̀ ga-edebe ihe o nyere n’iwu ma ọ bụ na ị gaghị edebe.
7 ka okwukwe unu nke a nwalere anwale,+ nke bara oké uru karịa ọlaedo nke na-ala n’iyi, n’agbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya,+ wee bụrụ ihe na-eweta otuto na ebube na nsọpụrụ mgbe a ga-ekpughe+ Jizọs Kraịst.