10 Ha wee malite ịkpọku Jehova ka o nyere ha aka,+ sị, ‘Anyị emehiewo,+ n’ihi na anyị ahapụwo Jehova wee fee Bel+ na ihe oyiyi Ashtọret+ ofufe; ugbu a kwa, napụta+ anyị n’aka ndị iro anyị, ka anyị wee jeere gị ozi.’
13 n’ihi mmehie niile nke Beasha na mmehie nke Ila+ nwa ya, bụ́ ndị ha mere, ndị ha jikwa mee ka Izrel mehie site n’iji arụsị ha na-abaghị n’ihe+ kpasuo Jehova bụ́ Chineke Izrel iwe.
15 sị: “Gịnị mere unu ji eme ihe ndị a? Anyị onwe anyị kwa bụ mmadụ+ ndị nwere otu ụdị adịghị ike ndị unu nwere,+ anyị na-ezisara unu ozi ọma, ka unu wee hapụ ihe efu+ ndị a ma bịakwute Chineke ahụ dị ndụ,+ onye kere eluigwe+ na ụwa na oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha.