13 n’ihi ya, njehie a ga-adịrị unu ka akụkụ gbawara agbawa ná mgbidi, bụ́ nke na-achọ ịda ada, ebe nupụtara enupụta ná mgbidi dị elu,+ nke nwere ike ịda na mberede, n’otu ntabi anya.+
3 N’ihi na ọhụụ a bụ maka oge a kara aka,+ o jikwa ọsọ na-eru ọgwụgwụ ya, ọ gaghị agha ụgha. Ọ bụrụgodị na o gbuo oge, na-atụ anya ya; n’ihi na ọ ga-emezurịrị.+ Ọ gaghị anọ ọdụ.