6 Mozis wee gwa Erọn, gwakwa Elieza na Ịtama bụ́ ụmụ ya ndị nke ọzọ, sị: “Unu ahapụla isi unu n’edozighị ya edozi,+ unu adọwakwala uwe unu, ka unu ghara ịnwụ, ka ọ gharakwa iweso nzukọ a dum iwe;+ kama ụmụnne unu bụ́ ụlọ Izrel dum ga-akwa ákwá maka ọkụ rere ha bụ́ nke Jehova kpatara.