9 Eze nwaanyị Shiba+ wee nụ akụkọ banyere Sọlọmọn, o wee jiri ajụjụ ndị na-agbagwoju anya+ bịa Jeruselem ịnwale Sọlọmọn, ya na oké ìgwè mmadụ so ya, tinyere kamel+ ndị bu mmanụ bọlsọm+ na ọlaedo+ dị nnọọ ukwuu nakwa nkume ndị dị oké ọnụ ahịa.+ O wee bịakwute Sọlọmọn gwa ya ihe niile dị ya n’obi.+