28 N’ebe ahụ, unu ga-efe chi dị iche iche,+ bụ́ ndị aka mmadụ mere, osisi na nkume,+ ndị na-apụghị ịhụ ụzọ ma ọ bụ ịnụ ihe ma ọ bụ iri ihe ma ọ bụ ịnụ ísì.+
17 Ma ọ na-eji nke fọrọ afọ pịa chi, bụ́ ihe oyiyi ọ pịrị apị. Ọ na-adara ya n’ala, kpọọrọ ya isiala, kpekuo ya ekpere, sị: “Napụta m, n’ihi na ị bụ chi m.”+
3 N’ihi na omenala nke ndị dị iche iche+ bụ naanị ume e kupụrụ ekupụ, n’ihi na ọ bụ osisi nkịtị+ dị n’ọhịa ka mmadụ gbuturu, bụ́ nke omenkà ji mma ịkwa osisi kwaa.+
26 Unu hụkwara ma nụ otú Pọl a si mee ka ìgwè mmadụ dị ukwuu kweta, meekwa ka ha nwee echiche dị iche, ọ bụghị naanị n’Efesọs+ kama n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ógbè Eshia dum, na-asị na chi ndị e ji aka mee+ abụghị chi.