Abụ Ọma 141:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Ọ bụrụ na onye ezi omume etie m ihe, ọ ga-abụ obiọma;*+Ọ bụrụkwa na ọ baara m mba, ọ ga-abụ mmanụ a wụsara m n’isi,+Nke isi m na-agaghị achọ ịjụ.+N’ihi na m ka ga na-ekpere ha ekpere ọbụna n’oge ọdachi dakwasịrị ha.+ Ilu 3:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 ha ga-abụkwara mkpụrụ obi gị ndụ,+ bụkwaara olu gị ihe ịchọ mma.+ Ilu 4:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Ọ ga-atụkwasị okpu ọma e ji okooko kpaa n’isi gị;+ ọ ga-ekpuwe gị okpueze mara mma.”+
5 Ọ bụrụ na onye ezi omume etie m ihe, ọ ga-abụ obiọma;*+Ọ bụrụkwa na ọ baara m mba, ọ ga-abụ mmanụ a wụsara m n’isi,+Nke isi m na-agaghị achọ ịjụ.+N’ihi na m ka ga na-ekpere ha ekpere ọbụna n’oge ọdachi dakwasịrị ha.+