25 O wee ruo n’afọ nke itoolu+ nke ọchịchị ya, n’ọnwa nke iri, n’abalị iri+ n’ọnwa ahụ, na Nebukadneza+ eze Babịlọn bịara,+ ee, ya na ndị agha ya niile, ibuso Jeruselem agha, o wee malite ịma ụlọikwuu ibuso ya agha, na-ewukwa mgbidi nnọchibido gburugburu ya.+