48 Ị ga na-ejere ndị iro gị, bụ́ ndị Jehova ga-ezite ibuso gị agha, ozi.+ Agụụ ga na-agụ gị,+ akpịrị ga na-akpọ gị nkụ, ị ga-agbakwa ọtọ ma nọrọ n’ụkọ ihe niile mgbe ị na-ejere ha ozi; ọ ga-anyawakwa gị yok ígwè n’olu ruo mgbe ọ lara gị n’iyi.+
22 Ha ga-asịkwa, ‘Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ Jehova+ bụ́ Chineke ndị nna nna ha bụ́ onye kpọpụtara ha n’ala Ijipt,+ ha wee soro chi ọzọ dị iche iche+ wee kpọọrọ ha isiala ma fee ha.+ Ọ bụ ya mere o ji mee ka ọdachi a dum dakwasị ha.’”+