4“Ugbu a, Izrel, gee ntị n’ụkpụrụ na mkpebi ikpe ndị m na-akụziri unu ka unu debe, ka unu wee dị ndụ,+ ka unu wee banyekwa ma weghara ala ahụ Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà na-enye unu.
5Mozis wee kpọkọta Izrel dum wee sị ha: “Izrel,+ nụrụnụ ụkpụrụ na mkpebi ikpe+ ndị m na-ekwu ná ntị unu taa, mụtakwanụ ha ma lezienụ anya ka unu mee ha.+