10 Ma, Jehova bụ Chineke n’eziokwu.+ Ọ bụ Chineke dị ndụ,+ bụrụkwa Eze ruo mgbe ebighị ebi.+ Ụwa ga-ama jijiji n’ihi iwe ya,+ ọ dịghịkwa mba ga-eguzo mgbe ọ ga-eweta amamikpe ya.+
26 M na-eti iwu+ ka ndị mmadụ na-ama jijiji n’ihu Chineke nke Daniel ma na-atụ ya egwu n’ókèala niile dị n’alaeze m.+ N’ihi na ọ bụ Chineke dị ndụ nakwa Onye na-adịru mgbe ebighị ebi,+ alaeze ya+ bụ nke a na-agaghị ebibi ebibi,+ ọchịchị ya na-adịrukwa mgbe ebighị ebi.+
3 N’ihi na e gosiwo na unu bụ akwụkwọ ozi Kraịst nke anyị onwe anyị bụ́ ndị ozi dere,+ nke a na-ejighị ink dee, kama e ji mmụọ+ nke Chineke dị ndụ dee ya, ọ bụghị ná mbadamba nkume,+ kama ná mbadamba anụ ahụ́, ya bụ, n’obi.+
9 N’ihi na ha onwe ha na-akọ akụkọ banyere otú anyị si bata n’etiti unu na mbụ, na otú unu si hapụ arụsị+ unu wee bịakwute Chineke ka unu wee bụrụ ohu ezi+ Chineke dị ndụ,+