-
Jenesis 21:22-24Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
22 N’oge ahụ, Abimelek na Faịkọl, onyeisi ndị agha ya, sịrị Ebreham: “Chineke na-anọnyere gị n’ihe ọ bụla ị na-eme.+ 23 N’ihi ya, jiri aha Chineke ṅụọrọ m iyi na ị gaghị aghọ mụ na ụmụ m na ụmụ ụmụ m aghụghọ nakwa na ị ga-egosi mụ na ndị obodo m, ndị bi n’ala a i bi, na ị hụrụ anyị n’anya* otú m gosiri gị.”+ 24 Ebreham wee sị: “M na-aṅụrụ gị iyi.”
-