-
1 Jọn 3:10-12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 Ọ bụ ihe a ka e ji amata ndị bụ́ ụmụ Chineke na ndị bụ́ ụmụ Ekwensu: Onye ọ bụla na-anaghị eme ezi omume esighị na Chineke, onye na-ahụghị nwanna ya n’anya esighịkwa na ya.+ 11 N’ihi na ihe a bụ ozi unu nụrụ ná mmalite, na anyị kwesịrị ịhụ ibe anyị n’anya.+ 12 Anyị ekwesịghị ịdị ka Ken, onye si n’ajọ onye ahụ, onye gbukwara nwanne ya.+ Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ maka na ọrụ ya jọrọ njọ,+ ma ọrụ nwanne ya dị mma.+
-