3 Unu erikọtala ya na ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha.+ Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko, bụ́ achịcha ahụhụ, ụbọchị asaa, n’ihi na unu si n’Ijipt pụta ọkụ ọkụ.+ Na-emenụ ihe a ka unu wee na-echeta ụbọchị unu si n’Ijipt pụta n’oge niile unu dị ndụ.+
7 Wepụnụ ihe ahụ na-eko achịcha, ka unu wee bụrụ ntụ ọka ọhụrụ a gwakọtara agwakọta, n’ihi na unu dị ka ntụ ọka a na-etinyeghị ihe na-eko achịcha. N’eziokwu, Kraịst ejirila ndụ ya chụọ àjà,+ si otú ahụ bụrụ nwa atụrụ anyị ji mee Ememme Ngabiga.+