12Jehova wee sị Ebram: “Kwapụ n’obodo gị, hapụkwa ndị ikwu gị na ezinụlọ nna gị, kwaga n’obodo m ga-egosi gị.+2 M ga-eme ka ị bụrụ nnukwu mba. M ga-agọzi gị. M ga-eme ka aha gị na-ede ude, a ga-esikwa n’aka gị gọzie ndị mmadụ.+
5 Chineke wee kpọpụta Ebram n’èzí, sị ya: “Biko, lelie anya n’eluigwe gụọ kpakpando ndị a ọnụ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịgụta ha ọnụ.” Chineke sịziri ya: “Otú a ka ụmụ* gị ga-adị ọtụtụ.”+
2 N’abalị, Chineke gwara Izrel okwu n’ọhụụ. Ọ kpọrọ ya, sị: “Jekọb, Jekọb!” ya azaa ya, sị: “Lee m!” 3 Chineke sịrị ya: “Abụ m ezi Chineke, Chineke nke nna gị.+ Atụla egwu ịga Ijipt, n’ihi na m ga-eme ka ị bụrụ nnukwu mba n’ebe ahụ.+
32 Ọ bụ ndị a bụ ndị Izrel e debara aha ha n’akwụkwọ n’ọnụmara n’ọnụmara ha. Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ ná ndị bi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, bụ́ ndị nwere ike ịga agha, dị narị puku isii na atọ, narị ise na iri ise (603,550).+