-
Ọnụ Ọgụgụ 14:13, 14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Ma Mosis gwara Jehova, sị: “Ndị Ijipt, bụ́ ndị i ji ike gị kpọpụta ndị a n’aka ha, ga-anụ ya.+ 14 Ha ga-agwakwa ya ndị bi n’ala a. Ndị bi n’ala a anụkwala na gịnwa, bụ́ Jehova, nọnyeere ndị a+ nakwa na ha ahụla gị ihu na ihu.+ Ị bụ Jehova. Ígwé ojii gị dị n’elu isi ha. I ji ogidi ígwé ojii na-ebutere ha ụzọ n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ na-ebutere ha ụzọ n’abalị.+
-