-
Ọpụpụ 37:17-24Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 O wee jiri ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe e ji adọsa ọkụ.*+ O ji hama kụọ ihe a e ji adọsa ọkụ. Ụkwụ ya, okporo ya, alaka ya, iko ya, isi ya, na ifuru ya bụ otu ihe.+ 18 O nwere alaka isii n’akụkụ ya abụọ. Alaka atọ dị n’otu akụkụ ya, alaka atọ adịrị n’akụkụ ya nke ọzọ. 19 Iko atọ ndị yiri okooko almọnd dị n’alaka nke ọ bụla dị n’otu akụkụ, otu isi na otu ifuru adịrị n’agbata otu iko na iko ibe ya. Iko atọ ndị yiri okooko almọnd dịkwa n’alaka nke ọ bụla dị n’akụkụ ya nke ọzọ, otu isi na otu ifuru adịrịkwa n’agbata otu iko na iko ibe ya. Ọ bụ otú a ka e si rụọ alaka isii ahụ ka ha si n’okporo ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* ahụ pụta. 20 E nwekwara iko anọ yiri okooko almọnd n’okporo ihe ahụ e ji adọsa ọkụ.* Otu isi na otu ifuru dịkwa n’agbata otu iko na iko ibe ya. 21 Otu isi dị n’okpuru alaka abụọ mbụ si n’okporo ahụ pụta. Otu isi dịkwa n’okpuru alaka abụọ ọzọ na-eso ha. Otu isi dịkwa n’okpuru alaka abụọ ọzọ na-eso ha, ya bụ, alaka isii ndị si n’okporo ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* pụta. 22 Ọ bụ otu ọlaedo a na-agwaghị agwa ka e ji rụọ isi ya niile na alaka ya niile na ihe niile dị n’ihe ahụ e ji adọsa ọkụ.* Ha niile bụ otu ihe e ji hama kụọ. 23 O jizi ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ọkụ* ya asaa+ na mkpà ndị e ji ejide owu ya na ihe ndị a ga-eji na-agụnye owu a mụrụ amụ. 24 O ji otu talent* ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe a e ji adọsa ọkụ* na arịa ya niile.
-