25 Chineke wepụtara ya ka ọ bụrụ àjà nke ga-eme ka ya na ụmụ mmadụ dịrị n’udo+ ma ha nwee okwukwe n’ọbara ya.*+ Chineke mere ihe a iji gosi na ya bụ onye ezi omume n’ihi na ntachi obi* ya mere ka ọ na-agbaghara mmehie ndị e mere n’oge gara aga.
2 Ọ bụ ya bụ Nna anyị. Ọ họọrọ unu maka na ọ bụ ihe o bu n’obi ime kemgbe.+ O ji mmụọ nsọ doo unu nsọ,+ ka unu wee na-erubere ya isi, dịkwa ọcha n’ihi ọbara Jizọs Kraịst.+
Ka Chineke meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.
5 Ka Jizọs Kraịst, “Onye Àmà Kwesịrị Ntụkwasị Obi,”+ “onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ,”+ na “Onye Na-achị ndị eze nke ụwa,”+ meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.