10 “‘Ọ bụrụ na ọ ga-esi n’ìgwè ewu na atụrụ+ weta ebule ma ọ bụ ewu a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ, o kwesịrị iweta oké nke ahụ́ dị mma.+ 11 A ga-egbu ya n’akụkụ ebe ugwu nke ebe ịchụàjà n’ihu Jehova. Ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà, ga-efesa ọbara ya n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà.+