-
Ọnụ Ọgụgụ 32:10-12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 Ezigbo iwe were Jehova n’ụbọchị ahụ. O wee ṅụọ iyi, sị:+ 11 ‘Ụmụ nwoke ndị si n’Ijipt pụta, malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe, agaghị ahụ ala ahụ+ m ṅụrụ iyi na m ga-enye Ebreham, Aịzik, na Jekọb,+ n’ihi na ha ejighị obi ha niile rubere m isi, 12 ma e wepụ Keleb+ nwa Jefune onye Kinaz na Joshụa+ nwa Nọn, n’ihi na ha ji obi ha niile rubere Jehova isi.’+
-